Akanu Ibiam Airport Enugu: Amalitebeghị ịnabata ndị njem na ya

Ọdọụgbọelu Enugwu
Nkọwa foto, Arụchabeghi ebe ndị njem si efepụ

Ka izuụka abụọ gachara kemgbe agbapere ọdọụgbọelu Akanu Ibiam dị n'Enugwu, ụgbọelu bu ndị njem efetubeghi ebe ahụ.

Ọ bụ n'ụbọchị 29 nke ọnwa Ọgọstụ ka minista na-ahụ maka njem ụgbọelu bụ Hadi Sirika gbapegharịrị ọdọụgbọelu Akanu Ibiam.

Ụbọchị ahụ mere ya otu afọ na ụbọchị isii a gbachiri ya maka ịrụgharị okporoụzọ ụgbọelu si ada.

Dịka Maazị Sirika na-eme emume mgbape ọdọụgbọelu ahụ, ọtụtụ mmadụ na-ekiri ya n'akara BBC Igbo na Facebook, jụrụ ihe mere e ji agbape ebe arụchabeghị arụcha.

Ajụjụ ahụ sitere n'igwe eji arị elu gbara ụlọezumike n'ọdoụgbọelu ahụ okirikiri.

Ụfọdụ mmadụ nọbu ekwu na o nweghị ihe nke ahụ mere, dịka ụgbọelu nwereike na-ada ka ọrụ na-aga n'ihu.

Mmepe Ọdọụgbọelu Enugwu
Nkọwa foto, Site n'akaekpe: Okwy Nwodo Gọvanọ Enugwu steeti na mbụ, Chief John Nnia Nwodo PG Ohaneze Ndigbo, onye bụbu Gọvanọ Anambra steeti na Minista ọrụ na inwe ọrụ, Chris Ngige, Onye bụbu osote onyeisioche na Sineti Ike Ekweremmadu, Onye nnọchịteanya Isuikwato/Umunneochi Federal Constituency, Abia steeti n'ụlọomeiwu nta Nkiru Onyejeocha, Gọvanọ Okezie Ikpeazu nke Abịa steeti.

Mana, BBC achopụtala na kemgbe ahụ emechara emume mgbape ahụ ụgbọelu efetụbeghị ebe ahụ.

Otu onye na-arụ ọrụ n'ime ọdọụgbọelu ahụ gwara BBC na ha mabu na agaghị amalite njem n'ọdọụgbọelu ahụ.

"Ọ bụ ka ha mepee ya tupu ọ gachaa otu afọ agbachiri ya mere ha jiri gbaa mbọ gbapee ya n'Ọgọstụ."

Ụfọdụ ndị ọrụ ọdọụgbọelu Akanu Ibiam

Onye ahụ achọghị ka e kwuo aha ya sịkwa na ha na-ele anya na e nwereike imalite njem na ọdọụgbọelu ahụ na ngwụcha ọnwa Ọgọstụ.

Mana Henrietta Yakubu bụ onyeisi ndị na-ekwuru ngalaba a kpọrọ "Federal Airports Authority of Nigeria" (FAAN) gwara BBC na ihe mere ejighi malite njem n'Akanu Ibiam esighi ha n'aka.

Ọ sị: "Anyị mechiri Akanu Ibiam maka okporoụzọ, ugbua arụchara ya, ọ dịrịla njikere maka njem."

Ka BBC jụrụ ya maka ihe kpatara ụgbọelu ejighi efetu maọbụ efepụ n'ebe ahụ, ọ sị na nke ahụ ga-esi ụlọọrụ ụgbọelu n'aka.

"Ha kwesịrị iwete "schedule njem ha", mana onwebeghị onye wetere nke ha. Nke gosiri na ha adịbeghị njikere.

Ọdọụgbọelu Enugu
Nkọwa foto, A rụchabeghị otu n'ime ụzọ ebe e si abata na ya bụ ọdọụgbọelu

N'ajụjụ igwe gbara ebe ahụ okirikiri, Odoziakụ Yakubu sị na usoro ha ma ha na-arụ ụdịrị ọrụ ahụ bụ itinye ihe Bekee na-akpọ "tent" iji hu na njem na-aga n'ihu.

Ọ sị na tupu izuụka a agaa, a ga-ewepụchaa igwe ndị ahụ.

Stanley Olisa bụ ọnụ na-ekwuru Air Peace gwara BBC na ọ bụ ndị gọọmentị ka ọ dịrị inye ụlọọrụ ụgbọelu ikike ịmalite njem n'ọdọụgbọelu ahụ.

O kwenyere na ya bụ ọdọụgbọelu adịrịla njikere maka njem, ma kwukwaa na ụlọọrụ Air Peace na-agba mbọ ka ha hụ na njem malitere n'Akanu Ibiam.

Okporoụzọ ebe ụgbọelu na

Ebe foto si, Felix Kelechi Ehenemba