Second Niger Bridge: Abụbụ ọrụ ndị na-aru akwa Niger nke abụọ emeela ka ọrụ kwụsị

Onye na-elekọta ọrụ gọọmentị etiti n'Anambra steeti bụ Ajani Adeyemo ekwuola na ọrụ akwụsịla n'akwa mmiri Niger nke abụọ.
Ọ kọwara BBC Igbo n'ekwentị na nke na-eme n'ihi esemokwu dapụtara n'etiti ndị obodo nakwa ndị ji ya bụ ọrụ bụ ụlọọrụ Julius Berger.
N'ọnụ ya, "Julius Berger kwụsịtụrụ ọrụ na ya bụ akwa mmiri n'ihi na ndị ọrụ gbara abụbụ ọrụ".
Iwe ndị obodo
Ọ sị na "ụfọdụ ndị mmadụ na-ekwu na aka ndị isi obodo akwa mmiri a metutara dị n'abụbụ ọrụ a"

Ebe foto si, @FMPWH/Twitter
BBC enwetefụghị ndi obodo ka ha kwuo uche ha, mana Maazị Adeyemo kwuur na ọ bụ maka ebinyeghi aka na nkwekọrịta ha na ụlọ ọrụ na-ese okwu.
Akụkọ ọzọ pụtara na-ekwu na ndị obodo ahụ bu iwe n'obi ebe onyeisi ọrụ na ụlọọrụ JB bụ Mr Weiser nọ.
Adeyemo kwetara nke a na-ekwu na o nwere nkwekọrịta ebinyebeghị aka na ya nke ndị obodo chere na ọ bụ Weiner na-egbochi ya.
"Ha na-ata Weiner ụta na ọ bụ ọgbatuhie ma kwuo na ọrụ agaghị aga ihu maọbụrụ na ewpụghị ya"
Gọvanọ Anambara etinyela aka
Mana ugbua, Gọvanọ na-achị Anambra steeti akpọọla nzụkọ ka-enweike kpee udo n'etiti ndị ahụ niile.
Onye ọzọ na-arụ ọrụ n'ime ngalaba na-ahu maka ọrụ na Naịjirịa achọghị ka BBC Igbo kwuo aha ya kwuru na okwunaụka a so na ihe ndị ha na-agabiga n'ọrụ na Naịjirịa.
"Mgbe Babatunde Fashola kwuru na ụfọdụ obodo bụ ọgbatuhie n'ọrụ gọọmentị na-arụ, ọ ụdịrị ihe a ka ọ na-ekwu maka ya".
BBC Igbo gbara mbọ maka ịnụta n'ọnụ Julius Berger mana ha asabeghị ajụjụ anyị zigara ha.
Cheta na amalitere ịrụ ọru na Akwa mmiri nke abụọ ga-esi Asaba gafee osimiri Naija ruo Onisha kemgbe mgbe Goodluck Jonathan na-achị.
Mana, ọ bụ n'ọchịchị Buhari ka ọrụ bịara kwanye ọkụ ruo ugbua ọkwụsịrị.











