2nd Niger Bridge: Ihe mere ndị Ogbaru ji chọrọ ịkwụsị ọrụ n'Akwammiri Naịja

Ebe foto si, Julius Berger
Kamgbe afọ 2018 gọọmentị etiti malitere ịrụ akwammiri Naịja nke abụọ, ọtụtụ nsogbu adapụtala n'etiti ndị obodo Ogbaru dị n'Anambra Steeti na ndị orụ.
Ndị Ogbaru sị na ndị ọrụ ngo ji akwammiri ahụ bụ Julius Berger manyere aka n'ala ha dị n'akụkọ ebe ahụ na-enyeghi ha ego itiaka n'obi ọbụla.
Nke mere ha jiri mee ngagharịiwe n'afọ 2018 sị na gọọmenti etiti na ụlọọrụ Julius Berger ga-akwụ ha ego itiaka n'obi dị nde narị naira ise.
Mana ọ dịka a ga-asị na nsogbu a mere ka ọ jụọla oyi amalitela ọzọ n'ụbọchị ole na ole gara aga.
Ugbua, ndị Ogbaru akpọpụla gọọmenti etiti, ụlọọrụ abụọ gụnyere Julius Berger na B and Q Dredging n'ụlọikpe ukwu dị n'Awka, Anambra steeti.
Ihe na-ewe ndị Ogbaru iwe

Ebe foto si, Julius Berger
Ndị Ogbaru gụpụtara ụfọdụ ihe ndị na-ewe ha iwe dịka;
- Na gọọmentị n ụlọọrụ Julius Berger manyere aka n'ala ndị obodo niile na-enyeghi ha ego itiaka n'obi.
- Ha kwuru na akwammiri Naịja nke abụọ emebiela ọtụtụ ụlọ obibi dị n'ebe ọ gafere site n'Asaba gawa Ogbaru ma kwụsị n'Obosi.
- Na ha enweghizi ezigbo mmiri ọṅụṅụ maka na orụ ahụ agbarụọla mmiri ha nke bụ na mmadụ nakwa anụmanụ nọzị n'izendụ.
- Ọzọkwa bụ na ili ndị ọgbarụ ụfọdụ abụrụla nke emebiri emebi.
Ndị Ogbaru sị ka gọọmenti etiti, ụlọọrụ Julius Berger nakwa B and Q Dredging ka ha mee ihe niile a ha chọrọ maọbụghị ya na ha ga-ewe iwu ma kwụsị ha ọrụ.
Onye na-anọchite anya mịnịstrị ọrụ n'Akwammiri '2nd Niger Bridge' bụ Ajani Razaaq Adeyemo gwara BBC Igbo uche gọọmentị banyere nke a.
Ọ sị na ọ bụ eziokwu na ndị Ogbaru na-esi ọnwụ ka a kwụọ ha ego itiaka n'obi kama kwuo na ọrụ ka na-agakwa n'ihu ebe ahụ.
Adeyemo kwere nkwa na a ga-arụcha akwammiri a n'ọnwa Febụwari 2022 dịka e ji yie ya na-agbanyeghi ọnwụ ndị Ogbaru na-esi.
Akụkọ ndị ga-amasị gị:










