Aisha Buhari: Ugboro ise o tiri mkpu maka Aso Rock

Aisha Buhari

Ebe foto si, Aisha Buhari Facebook

Nkọwa foto, Nwunye Buhari na-ekwukarị uche n'ihe gbasara gọọmenti di ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Nwunye onyeisiala Naijirịa bụ Aisha Buhari abụghị onye a na-afịonye n'akpa.

Ọ bụ onye na-ekwupụta uche obi ya oge niile.

Akụkọ a ga-egosipụta oge ise ude ya dere Naijirịa maka okwu o kwuru.

"Ka onyeisi ndị uweojii tọghapụ ndị ọrụ m"

Ọ bụ n'ụbọchị Tuzde ka akụkọ na-ekwu na-agbara egbe n'ụlọ obibi onyeisiala.

Akụkọ na-ekwu na nwunye onyeisiala chọrọ ka onye ọrụ enyemaka nke onyeisiala Muhammadu Buhari bụ Sabiu Yusuf dopụ onwe ya iche dika o si Legọs bata Abuja maka mgbochi nje coronavirus.

Akụkọ gara n'ihu kọwaa na Aisha, ụmụ ya abụọ na onye nchekwa ya soro gaa ị gwa Sabiu ka ọ dopu onwe ya iche izuụka abụọ dịka iwu kwuru.

Aisha na onye ọrụ ya

Ebe foto si, aishambuhari/Twitter

Nke a butere esemokwu dịka Sabiu jụrụ were sị na ọ bu gini mere nwunye onyeisiala agaghị gwa onye na-ahụ maka ndị ọrụ bụ Ibrahim Gambari ka ọ dopu onwe ya iche dịka ọ na-emekarị njem oge niile.

Onye nchekwa Aisha bụ Usman Shugaba gbara egbe dịka ha chọro iji ike jide Sabiu, kama sabiu riri mbọmbo ọsọ.

Onyeisi ndị uweojii na Naijirịa bụ Adamu Mohammed nyere iwu ka anwuchie ndị nchekwa nwunye onyeisiala n'ihi ha sị na ịgba egbe n'ụlọ obibi onyeisiala dara iwu.

Nke mere ka Aisha Buhari gaa n'akara Twitter ya si ka onyeisi ndị uweojii tọghapụ ndị nchekwa ya ha nwuchiri.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

"Garba Shehu na-ebuso ezinụl m agha" - Aisha Buhari

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

N'ụbọchị iri na otu nke ọnwa Disemba afọ 2019 ka nwunye onyeisiala Naijirịa bụ Aisha Buharị depụtara akwụkwọ ebe o boro onye na-ahụ maka mgbasa ozi nke onyeisiala bụ Graba Shehu ebubo imegide ya na ezinụlo onyeisiala.

Aisha Buhari kwuru na Shehu nwere ndị ọ na-arụrụ na ọ bụghị onyeisiala ma sị kwa na o bụ ndị a na-agwa ya ihe ọ na-eme.

O kwukwara na Garba Shehu anaghị arụ ọrụ ya dịka onye mgbasaozi onyeisiala dịka ọ naghi egosipụta ezigbo ọrụ onyeisiala na-arụ.

Aisha Buhari ji akụkọ wuru na e ji ike gbachịgide ya n'ụlọ n'ihi na onyeisiala chọrọ ịlu nwunye ọzọ were maa atụ.

Ọ kọwara na Garba Shehu ma na akụkọ abụ bu asi ma na onweghi ihe o kwuru maọbụ mee iji hụ na eziokwu pụtara ihe.

O kwukwara na Shehu na-etinye aka n'ụlọ ọrụ nwunye onyeisiala na-agbanyeghi na ọ gbasaghị ya.

"Enwerike agaghị m akwado di m n'oge ntụlịaka" - Aisha Buhari

Oge ntụliaka Muhammadu na Aisha Buhari

Ebe foto si, AFP

Mgbe nwunye onyeisiala Naijirịa bụ Aisha Buhari na ndị BBC nwere mkparịta ụka n'ọnwa Oktoba afọ 2016, ọ gwara ha na o nwerike ọ gaghị eso na ntụliaka agba nke abụọ e mere n'afọ 2019.

Aisha sị na nke a bụ maka na ụfọdụ ndị a napụla dị ya ike ọchịchi nke butere na ụfọdụ ndị nọ n'oche ọchịchi di iche iche abụghị ndị otu ndọrọndọro APC ma sị kwa na ha amaghị atụmatụ otu ha hiwere maka ọ dị mma Naijirịa.

Gere ya ebe a BBC

"Naijirịa kwesịrị inyocha Soshal Midia"

Mgbe ndị ụloomeiwu na atule ma ha a ga-ehiwe iwu ga-amachị ma nyocha ihe ndị Naijirịa na-eme na Soshal midịa ka Aisha Buhari kwadoro ka ndị ụlọomeiwu hiwe ya bụ iwu .

O kwuru sị " Maka okwu soshal midia a, ị kwesiri ị nọ n'ụlo gị na-atụ asị kwuo na osote onyeisiala akwụsịla ọrụ?

Okwu a abụghị obere okwu. Ọ bụrụ na mba Chaina ga-enyocha nwụ ihe mmadụ otu ijeri na ụma na-eme na soshal Midia, enweghị ihe m hụrụ dị njọ ma Naijirịa na-enocha mmadụ nde nari iri asatọ".

Nke kpasuru ọtụtụ ndị mmadụ iwe nke ha gosipụtara na soshal midia.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Skip X post, 4

End of X post, 4

Skip X post, 5

End of X post, 5

Skip X post, 6

End of X post, 6

Skip X post, 7

End of X post, 7

"Amaghị m otu ndọrọndọrọ nwunyem nọ kama ama m na ọnọdụ ya bụ na usekwu m, obi m na ime ụlo nke ọzo" - Muhammadu Buhari

Buhari na Aisha Buhari n'oge ntụliaka afọ 2015

Ebe foto si, Getty Images

Mgbe ndị BBC na Aisha Buhari nwere mkparịtaụka, o kwuru na onyeisiala Muhammadu Buhari amaghị ọtụtụ ndị ya na ha so arụ ọrụ, ma sịkwa na ọ dịrị etu a na ya agaghị eso mee ntuliaka.

Dịka onyeisiala Buhari gara mba Jamanị, ndị ntaakụkọ jụrụ ya maka ihe Aisha kwuru o were zaa ha na ọrụ nwunye ya nọ, kama na ihe ọ ma bụ na ọ bụ n'usekwu ya na 'imeụlo nke ọzọ' ka nwunye ya nwere ọnọdụ.

Okwu a kpasuru ọtụtụ ụmụnwaanyị iwe nke mere ka ha metere Aisha ebere.