Nnamdi Kanu bụ onye iro ndị Biafra na-agwa ndị mmadụ ka ha gbuo m - Asari Dokubo
Asari Dokubo bụ ọnye ndọrọndọrọ ọchịchị si obodo Ijaw ekwuola ka Nnamdi Kanu bụ onyeisi otu Indigenous People of Biafra (Ipob) kwụsị izite ndị mmadụ ka ha gbuo ya.
O kwuru na Nnamdi Kanu bụ onye iro Biafra makana a na-akwụ ya ụgwọ ibuso ọchịchọ Biafra agha.
Dokubo kwuru na ọ dịghị mma na Kanu nọ na mba Amerịka na-agwa ndị mmadụ ka ha gbuo ndị Biafra.
Mgbe BBC Igbo kpọrọ ọkaiwu Ipob bụ Alloy Ejimakor ka o kwuo maka ebubo a Asari Dokubo boro Nnamdi Kanu, ihe ọ sara dị n'ihe nkiri a dị n'akụkọ a. Gere ya n'uju.