Ada Jesus Comedy: Ọrịa m na-arịa abụghị maka Odumeje maọbụ Pericoma

Aha onyonyo, Ada Jesus Comedy sị na ya arịọla ndị niile ya mejọrọ mgbaghara

Nwa ada Mmesoma Mercy Obi, onye e ji Ada Jesus mara, bụ onye ọkpa ọchị na soshal midia.

Ya bụ nwa ada nọ na nnukwu ọrịa ugbu, mana ọtụtụ kwenyere na ọrịa a bụ maka mkparị ọ kparịrị ụfọdụ ndị mmadụ na soshal midia.

Ihe na-ewu na'ebe niile bụ na ọ bụ ihe o kwutere n'ọnụ na-arịa ya.

BBC Igbo gbara Ada Jesus Comedy (Mercy Ada Jesus) ajụjụ ọnụ n'akwa ọrịa ya.

Leekwa ihe ọ sara anyị maka ya bụ ọrịa na ebubo sọ ya n'azụ.

Kirie ya.