Meghan na Harry: Obieze Buckingham ekwuola na ha na-enyocha ebubo Meghan boro ha

Ebe foto si, Joe Pugliese/ Harpo Productions/ CBS
- Onye dere ya, Joice Etutu
- Ndị mere akụkọ a, BBC News
Obieze Buckingham nke mba Briten ekwuola na ha ejighi ihe ndị Meghan bụ nwunye Harry kwuru egwu egwu ma ncha.
Ha kwuru n'ime ozi ha wepụtara ma ha ga-enyocha ya n'ihi na ọ bụ ihe na-ebutere ha oke echieche.
Ha kwuru na etu e si cheta ihe nwereike ị dị iche mana ntule imeụlọ ga-abịa na mmezu.
Ha kwukwara na Ọkparaeze Harry na nwunye ya bụ Meghan ka bụ ndị ezinaụlọ ha ha hụrụ n'anya.
Meghan, Harry na mba UK: Kedụ ebe mmiri si baa n'opi ụgbọgụrụ?

Ebe foto si, NEIL HALL/EPA
Prince Harry na Meghan Merkle - Duke na Duchess nke Sussex - nwere mkparịtaụka na TV, ha na Oprah Winfrey, ebe ha nọrọ kwuo gbowam ihe kpatara ha ji si n'ezinụlọ obi eze nke mba UK pụọ.
Di na nwunye a bụ ndị a na-ahụtabu dịka ndị ga-eweta mgbanwe ọgbaraọhụrụ n'ezinụlọ ọchịchị nke mba England, tụrụ ọtụtụ mmadụ n'anya oge ha kwuru na ha ga-esi n'obi eze pụọ gaa mba Amerịka.
Mana kedụ ebe mmiri si baa n'opi ụgbọgụrụ?
Akụkọ ịhụnanya na-enweghị atụ

Ebe foto si, Pool via Reuters
Na ngwụcha 2016 ka akụkọ malitere ifegharị na Prince Harry na Meghan Markle na-ayị. Ọ bụ n'aka otu enyi ha ka ha abụọ si mata onwe ha.
O teghị aka, ihe dịka ọnwa iri na asatọ, ha abụọ kwupụtara na ha chọrọ ịlụ onwe ha.
Ndị ntaakụkọ buru akụkọ dị icheiche gbasara ha n'ihi na ndụ ha abụọ na-amasị ndị ntorobịa.
Oge ha gbara akwụkwọ n'ọnwa Mee afọ 2018, puku kwuru puku mmadụ nọjuru n'okporoụzọ iji kelee ha, ebe ihe karịrị mmadụ nde iri na atọ lere agbamakwụkwọ ha na TV.
Mana kedụzi ebe ihe nọrọ gahie?

Ebe foto si, Robert Alexander/Getty Images
Oge Harry na Markle gbara akwụkwọ, ọtụtụ chere na nnukwu mgbanwe ga-abata n'ezinụlọ oche eze nke mba England.
Nke a bụ maka na Markle bụ onye ojii, bịa bụrụkwa onye mba Amerịka nakwa onye lụrụla di mbụ ma gbasaa.
ọzọkwa bụ na Markle bụ onye nwere nkwuwa okwu gbasara ikike dịịrị ụmụnwaanyị.

Ebe foto si, Chris Jackson/Getty Images
Na ngwụcha 2016, oge Prince Harry kwupụtara na ya na Markle na-ayị, ụfọdụ ụlọọrụ ntaakụkọ dere akụkọ gbasara Markle, nke mere ka Harry baa mba ma katọọ ha.
O kwuru na ya agaghị agbachi nkịtị ka e mekpaa Markle ahụ maọbụ menye ya ihere.
Onye ntaakụkọ ma maka oche eze mba Britain nke ọma, bụ Jessica Morgan, kwuru na "Harry hụrụ etu ndị ntaakụkọ si kpaso nne ya agwa, ya mere ọ chọghị ka otu ihe ahụ mee nwunye ya."
"Daina (nne Harry) bụ onye nwere nkuwa okwu, mmadụ enweghị ike ikpuchi ya aka n'ọnụ."
Ọ bụ ihe meburu mbụ na-achọ ime ọzọ?

Ebe foto si, Tim Graham/Getty Images
Oge a lụbatara Diana Spencer n'ezinụlọ obi eze, ndị ntaakụkọ kọrọ akụkọ ọma dị icheiche gbasara ya.
Mana oge ya na di ya bụ Prince Charles gbasara, ndị ntaakụkọ malitere isogharị ya, na-ese ya foto na nzuzo.
Otu foto e setere ebe Diana na enyi ya nwoke ọhụrụ bụ Dodi Fayed sere, dara ihe karịrị otu nde dọla n'ọnụ ahịa.

Ebe foto si, Princess Diana Archive/Getty Images
Ọ bụ ebe ndị ntaakụkọ na-esogharị Diana na enyi ya nwoke ka ha nwere ihe mberede okporoụzọ nke gburu ya n'afọ 1997.
Ọnwụ Diana mere ka ụmụ ya abụọ kpọọ ndị ntaakụkọ asị n'ihi na ha hụrụ etu ha si nye nne ha mmekpa ahụ.
Markle na ndị ntaakụkọ

Ebe foto si, NEIL HALL/EPA
Ịpụta n'akwụkwọ ntaakụkọ abụghị ihe ọhụrụ maka Prince Harry, n'ihi na o si n'obi eze.
Mana ndị ntaakụkọ bịara gbado anya n'akụkọ gbasara Markle - ebe o si, ezinụlọ ya, nkewa ya na di ya nke mbụ, ọrụ ọ rụburu, na ihe ndị ọzọ.
Oge Meghana batara n'ezinụlọ eze mba Britain, ndị ntaakụkọ malitere ide ihe ọma gbasara ya, mana o teghi aka, akụkọ ha malitere ịgbaso ịkpa oke agbụrụ.
Ọtụtụ akụkọ a na-ede gbasara Markle mere Harry ji wepụta akwụkwọ ozi n'ọnwa Ọkutoba afọ 2019 iji katọọ ya.
N'ọnwa Eprel 2020, di na nwunye ahụ kwuru na ha agaghịzi agwa ụlọọrụ ntaakụkọ 'Daily Mirror', 'the Sun', 'the Daily Mail' na 'the Daily Express' okwu.
Gịnị pụtara ihe na mkparịtaụka a ha na Oprah Winfrey nwere?

Ebe foto si, Harpo Productions - Joe Pugliese
Mkparịtaụka a nke Oprah Winfrey na Duke na Duchess nke Sussex nwere bụ nke ọtụtụ mmadụ tụrụ anya ya.
Otu ihe kacha gbaa ọkpụrụkpụ na ya bụ ebe Markle kwuru na ezinụlọ eze nọ na-enwe mkparịtaụka ma nwa ọ dị ime ya ọ ga-adị oji.
Markle kwukwara na oge ihe ndị a na-eme, ọ chere echiche igbu onwe ya n'ihi na o nweghị onye enyemaka.
N'aka nke ya, Prince Harry kwuru na o wutere ya na ezinụlọ ya gbara nkịtị oge ndị ntaakụkọ na-ede ọtụtụ akụkọ ndị a gosipụtara ịkpa oke agbụrụ.
Harry kwuru na ọ gbalịrị ibu ibu ahụ naanị ya.
"Enweghị m ike ịmata etu nne m bụ Diana si buo ibu ahụ naanị ya n'afọ ndị a gara aga."
"Ọ dịghịrị mụ na Markle mfe, mana anyị abụọ nọ ebe a ịkasi onwe anyị obi."











