Buckingham Palace: Harry na Meghan agaghị azazị Aha Eze ha

Ebe foto si, Getty Images
Nwaeze Harry na nwunye ya ekwuola na ha ga-akwụghachị nde pawund abụọ na ọma ejiri ruzie ụlo obibi 'Frogmore Cottage' nke dị n'akaobi Eze ndị UK.
Dị na nwunye a agaghịzị anọchite anya Eze nwaanyị ebe ọbụla.
Ọ bụ na oge udu mmiri ndị mba Briten ka iwu a ga-ebido ọrụ.
Lee ozi sị n'aka Eze Nwaanyị
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post
N'Anambra steeti

Ebe foto si, AFP
Ndị uweojii nke Anambra steeti esitela n'ọnụ onye na -ekwuchitere ha bụ Orlando Ikeokwu were dọọ ndị steeti ahu aka na nti were si na ọnye ọbụla chọro ime nkagharị iwe mee ya dịka iwu Naijirịa si kado.
Ndị uweojii sị na na-ama ọkwa a maka akụkọ na enwere ndị chọrọ ime ngagharị iwe maka ikpe ekpere nke mere Hope Uzodinma Gọvanọ Imo steeti .
Ada 'El Chapo' ebidola ire mmanya ọkụ n'aha nna ya.

Ebe foto si, Getty Images
Nwada bụ Alejandrina Guzman ebidola iji aha papa ya ere mmanya ọkụ na mba MExico nke ọ kpọrọ 'EWl Chapo'.
N'otu aka ahụ ka ha nwere ụlo ọrụ na-arụpụta akwa oyiy nke ha kporo 'El Chapo 701'.
Ha nwetere aha a dịka ndị 'Forbes' kpọrọ Joaquin 'El Chapo' Guzman onye nke nari asaa na otu kacha nwee ego n'ụwa niile.
Alejandrina na akọwa na ọ bụ osikapa, mmanu aṅụ na 'Malt' ka ha ji mee ya bụ mmanya.
Dịka osirị kwuo, "Ọ dị nọọ mma".
El Chapo bụ onye na-ere ọgwụ ike ama ama na-ezu ike na mkpọro ụgbụa dịka ndị mba Amerịka tụrụ ya nga maka mgbere ọgwụ ike.

Ebe foto si, Getty Images
Otu nwaanyị ekwuola na jigida ya zọpụtara ya n'aka ndị chọrọ iji ike wakpo ya na mba Lebanon.
Gloria Tayelolu Bright kọwara na ọ bụ aghụghọ ịnye ya ọrụ onye nkuzi Bekee ka eji rapụta ya na mba Lebanon ebe o bidoro ị ta ahụhụ.
Ọ kwuru na onyeisi ya n'ọrụ bidoro ịnye ya nsogbu mmekọ ahụ mgbe niile mana ọ kwụsịrị mgbe ọ gwara ya maka jigida ya.
N'ọnụ ya "a gwara m ya na nwoke ọbụla dinara m karịa onye nyere m jigida a ga-agbapụ ara ma nwụọ n'abalị asaa, ya mere o ji hapụ m aka"
Gloria ji ụmụaka abụọ so na ndị atọghapụrụ na mmegbu na Lebanon.
Gọọmentị na-akụrị ulọ n'Ọchanja

Gọọmentị Anambra steeti amalitela ịkụtu ụlọ ndị gbara ọkụ n'ahịa ọchanja dị n'ọnịcha.
Dịka ụlọntaakụkọ ABS siri kwuo, ụfọdụ ụlọ ndị dị ebe ahụ na-amazi jijiji nke nwereike ịdagbu mmadụ maọbụrụ na amaghị ihe e mere ya.
N'ofesi

Ebe foto si, Getty Images
Nwoke kachasị dị mkpụmkpụ na ndị ji ụkwụ aga ije n'ụwa niile anwụọla dịka ọ gbara afọ iri abụọ na asatọ.
Khagendra Thapa Magar nwụrụ n'ụlọọgwụ dịka ọ rịachara ọrịa mkpụrụ obi.
N'egwuregwu,
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ọgbaa bọọlụ Naịjirịa bụ John Ogu ekwuputala obi ụtọ ya n'ịlaghachi agba bọọlụ dịka ọnwa isii gachara.
Ogu gbaara otu ọhụrụ ya bụ Aladalah asọmpị mbụ n'ụbọchị Fraide.
Uzodinma achụọla ndị niile Ihedioha were n'ọrụ okpuruọchịchị n'Imo steeti

Ebe foto si, BBC
Aka na-achị Imo steeti bụ Hope Uzodinma achụọla ndị niile onye ọnọchiri bụ Emeka Ihedioha were n'ọrụ ilikọta okpuru ọchịchị ime obodo nke steeti ahụ.
Ihedioha chụrụ aka na-achị ukpuru ọchịchị iri abụọ na asaa dị n'Imo steeti ka ọ rigoro ọkwa gọvanọ n'ọnwa Mee nke 2019.
Ndị a Ihedioha chụru bu ndi meriri ntuliaka gọọmentị Okorocha mere iji họputa aka ga-achị okpuru ọchịchi ime obodo ndi n'afọ 2018.
N'Imo kwa, kepu kepu na-eru anyi ntị bụ na-amalitela inyeghachị ndị mmadụ ụgbọala na akụnaụba ndị ọzọ gọọmentị Ihedioha nara ha.
Gọọmentị Ihedioha nakọrọ akụnaụba ndị a site na ngalaba o hibere maka nke a.
Na Chaịna,

Ebe foto si, Getty Images
A na-enyochazị ndi ji ụgbọelu eme njem na mpaghara Chaịna maka nje ọhụrụ gburu mmadu abụọ kemgbe ọpụtara mbụ n'obodo Wuhan n'ọnwa Decemba 2019.
Ndị ọkachamara n'ihe banyere ọrịa sị na agbanyeghị na ọ bụ mmadụ iri anọ na ise ka eji igwe eji enyochapụta ọrịa ahụ n'ahụ ndị ọ fesagoro ga-eru puku n'ọma.
Mbughari Iko Mba Afirịka etinyela Jurgen Klopp na gbagharịa

Ebe foto si, EPA
Onye ndụ Liverpool bu Jugen Klopp na-akwa akwa arịrị maka etu e si buga iko mba Afirịka gawa ọnwa Janụwarị.
Ọ sị na nke ga-eme ka ha gbara aka Sadio Mane, Mohamed Salah na ndi ọzọ gawa ịsọmpị n'oge dị ha ezigbote mkpa.
Gee akụkọ ụwa n'otu nkeji ebe a









