Duke of Edinburgh Prince Phillip: "Ọ na-agbake nwayọ nwayọ" - Ọbieze Buckingham

Ebe foto si, PA Media
Ụlọeze ndị Buckingham ekwuola na Duke ndị Edinburgh "na-agbake nwayọnwayọ ma na ahụ adịwala ya mma" dịka a na-agwọ ya maka ọrịa o butere mana atụghị anya na ọ ga-apụta n'ụlọọgwụ ruo abalị asaa.
Cheta na e nyere Ọkparaeze Edinburg akwaoria n'ụlọọgwụ n'abalị Tuzde, otu ụzọ iji kee nkwụcha maka oyii mekpara ya ahụ, dịka odeeakwụkwọ ndị obieze obodo Buckingham si kwuo.
A gwara ndị BBC na e dugara Prince Philip gbara afo iri itoolu n'itoolu n'ụlọgwọ (afọ 99) King Edward nke asaa bụ otu ụzọ ịkpachapụrụ ya anya dịka onye dọkịnta si nye ntuziaka.
Akụkọ banyere onye Eze, onye ji ezi obi merubere ncheta ọmụmụ afọ otu narị ya na abalị iri nke ọnwa Juun, no n'ụlọ ọgwụ ebe atụwara anya na ọ ga anọ mkpụrụ abalị ole na ole ka elebere anya ma mee ka o nwetu ezumike.

Ugoeze onye gbara afo iri itoolu na ano ka no na obodo Windsor.







