South East Security: Ihe niile i kwesịrị ịma maka otu nche ọhụrụ ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ hibere

Ndị nchekwa 'Forest Rangers'

Ebe foto si, Enugu State government

Nkọwa foto, Gọọmentị Enugwu steeti hibere otu nche a kpọrọ 'forest rangers'

Dịka ohi, ntọ na igbu mmadụ dị ka ọ na-arị elu na Naịjirịa, ndị gọvanọ mpaghara dị icheiche ehiwela otu nche nke ha.

Otu ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ kwuru na ha ehiwela otu nchekwa nke ha kamgbe ọnwa Jun 2019.

Ọ bụ n'ọgbakọ ha nwere n'ụbọchị 9 nkd Februwarị ka ha kwuru nke a.

Nzukọ ndị gọvanọ ọwụwanyanwụ n'Enugwu

Ebe foto si, Gov. Ifeanyi Ugwuanyi/Facebook

Nkọwa foto, Nzukọ ndị gọvanọ ọwụwanyanwụ n'Enugwu

Ndị mpaghara ọdịda anyanwụ ehibela otu nke ha a kpọrọ 'Amotekun', ebe ndị mpaghara ugwu nwere nke ha kpọrọ 'shege fa fasa'.

Mana ndị otu gọvanọ ọwụwa anyanwụ kwuru na ha enwetabeghị aha maka otu nche nke ha hibere ọhụrụ.

Lee ihe anyị ma gbasara otu nche ọhụrụ a:

Gọvanọ Willie Obiano nke Anambara steeti

Ebe foto si, Anambra Broadcasting Service

Nkọwa foto, Gọvanọ Willie Obiano nke Anambara steeti yi akwa ndị ọrụ nchekwa

Otu jikọrọ ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ hibere otu nche a n'abalị 28 nke ọnwa Julaị afọ 2019.

  • Ha hibekwara kọmiti ga-ahazi otu ndị nche ahụ n'abalị 31 nke Ọgọst 2019.
  • Kọmiti ahụ ga-agba mbọ ịhụ na ụlọomeiwu niile dị n'ọwụwa anyanwụ ga-emepụta iwu ọhụrụ ga-akwado otu nche ọhụrụ ahụ.
  • Otu nche ọhụrụ a enwebeghị aha; kọmiti ahụ ga-ecehpụta aha a ga-akpọ ya.
  • Ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ edegarala gọọmentị etiti akwụkwọ iji kọọrọ ha maka atụmatụ nche ọhụrụ a.
  • Ha ga-akpọkwa gọọmentị etiti ka ha bịa were anya ha hụ ya ma ọ malite nke ọma.
  • Ka ọ dị ugbua ndị nche 'vigilante' na ndị nche ime obodo a kpọrọ 'forest guards' ka na-arụgodi ọrụ nche ugbua.
Amotekun
Nkọwa foto, Ụgbọala ndị nche Amotekun

Cheta na gọọmentị etiti gbarụrụ ihu oge ndị gọvanọ ọdịda anyanwụ malitere otu 'Amotekun'.

Nke a mere ka ndị mpaghara ahụ ọnụ na-eru n'okwu gara n'obi gọọmentị n'Aso Rock ebe ha nọrọ kapịa ya ọnụ.

Ọ bụ eziokwu na ndị ọchịchị na mpaghara ugwu ekwenyeghi na ọ dị mma ka mpaghara dị icheiche nwee ndị nche nke ha.

Mana ndị nkwado atụmatụ na-ekwu na onye arachaghị ọnụ ya, ụgụrụ arachaa ya.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasị gị:

Aha onyonyo, Ntaramahụhụ n'aka ndị ọrụ nchekwa.