Orji Uzor Kalu: 'Aka Tinubu dị na mkpọrọ a tụrụ m'

Ebe foto si, Orji Uzor Kalu/Facebook
Omeiwu, Orji Uzor Kalu a tụrụ mkpọrọ afọ iri na abụọ etiela mkpu n'ọzara maka mkpọro a tụrụ ya.
Ọ sị na ọ bụ Ahmed Bola Tinubu, onyendu ha n'All Progressives Congress (APC) bụ onye dowere ya na ya bụ ọnọdụ.
Kalu sị na ọ bụ makana Tinubu na-atụ egwu na ya ga-apụta ịzọsa ya ọkwa onyeisiala n'afọ 2023.
Ọ sị na ndị ajọ mmadụ na pati ha bụ APC jere mebie aha ya n'agbanyeghị ahụhụ niile na aja ọ chụụrụ ha.
Kalu bụ onye gwara ụlọntakụkọ AlJazeera Naịjirịa nke a n'ụlọmkpọrọ ebe ọ nọ nke dị na Kuje, n'Abuja, kpọrọ Tinubu aha hoo haa dịka onye bụ nsogbu ya.
Ọ sị na Tinubu ma na ya bụ "anya ndị ọwụwa anyanwụ" nke bụ na ọ na-atụ ya egwu maka imeri ya na ya bụ ntuliaka onyeisiala nke afọ 2023.
PDP amapụtala ezi n'iwe

Ebe foto si, PDP/Twitter
Dịka otu PDP n'Imo steeti kpọrọ ekwo nkụ na ha ga na-eme ngagharịiwe ruo mgbe enyehachịrị ha ọchịchị, ndị otu ha n'Abuja eburula ngagharịiwe gaa ngalaba European Union na African Union ebe a nabatara ha.
Ya bụ ngagharịiwe malitere n'elekere iri nke ụtụtụ Tuesday.
Omar al-Bashir nwereike ịga mkpọrọ ọzọ

Ebe foto si, Reuters
Ndịisi ọchịchị mba Sudan akpọfeela Omar al-Bashir bụbu onyeisiala ha n'aka ụlọikpe mbaụwa bụ International Criminal Court.
Ebe ahụ ka a ga-ekpe ya ikpe ọchụ, mkpagbu nakwa imebi iwu agha n'ọgbaghara dakwasịrị mba ahụ n'afọ 2003.
Ọkụ ọgbụgba n'akụkọ Ọdọugboelu Sam Mbakwe
Content is not available
View content on FacebookBBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga.sEnd of Facebook post
Ndị ọrụ Federal Airport Authority nke Nigeria ekwuola maka ọkụ gbara n'ọhịa n'akụkụ ọdọugbọele Sam Mbakwe dị n'Owerri, Imo steeti.
Dịka ha kwuru na ya bụ ọkụ emetutaghị ọrụ ha, ha rịọrọ ndị bịketere ya bụ ọdọugboelu ka ha kpachara anya maka itinye ọkụ n'ọhịa ọkachasị n'ụgụrụ a.
Ọkaibe asọmpi ụmụnwaanyị

Echi bụ Wenezde ka a ga-akpọpụta aha ndị ga-azọ ọkwa nturuugo Ụmụnwaanyị ọkaibe n'egwu bọọlụ nke ndị BBC na-ahazi.
A ga-akpọpụta aha otu onye n'ime mmadụ ise ga-azọ ya bụ ọkwa n'ụbọchị abụọ nke ọnwa Maachị 2020.
Ndị Boko Haram atọhapụrụ

Ebe foto si, Getty Images
Gọọmentị Borno steeti ekwuola na ndị agha Naijirịa atọhapụla ndị Boko Haram chegharịri echegharị ruru otu puku na narị anọ.
Kọmishona mgbasa ozi na Borno steeti bụ Babakura Jato sị kama na ọ bụghị ha niile bụ ndị Boko Haram na ụfodụ bụ ndị eboro ebubo i so n'otu ahụ.
Jato kwuru na ọ bụ kamgbe afo 2019 ka ha bidoro ịnwọharị ndịa.
O kwuru na ụfodụ ndị a bụ ndị ụfọdụ ndị ezinaụlọ ha so n'otu Boko Haram ebe ụfọdụ n'ime ha bụ ụmụ ndị Boko Haram.
Jato kwụru na ụfodu n'ime ha, na ndị obodo ha na-achụpụ ha nke mere ka ha chọrọ ha ebe obibi ọzọ.
O kwukwara sị na-enwebeghị mgbe onye ha tọhapụrụ laghachiri soro Boko Haram.

Ebe foto si, Getty Images
Ụlọọrụ na-anọchite anya mba Chaịna na Naịjirịa ezitela akwụkwo ebe edeturu atụmatụ na ntụzi aka bụ nke a ga-eji buso ọrịa coronavirus agha.
Dịka onyeisi ndị ọrụ gbatagbata Legọs steeti bụ Olufemi Oke-Osayintolu si kwuo, atụmatụ a gụnyere ihe dị icheiche e nwereike ime iji chọpụta ya bụ ọrịa n'oge.
Ntuziaka ndị ahụ gụnyere:
- Nnyocha ahụ bụ nke bekee kpọrọ lab test.
- Igbado anya etu ọrịa si agbasa bụ nke a kpọrọ 'Epidemic Update' na bekee.
- Ịkpachapụ anya maka etu ọrịa si efe (Risk Assessment)
- Ụzọ nchọpụta na ọgwụgwọ ọrịa ahụ (Diagnosis and treatment protocol).
- Ịkpachapụ anya maka ndị metụrụ onye bu ọrịa a ahụ (Management of Close Contacts).
- Ike nkwụcha nakwa ime nnyocha miri emi gbasara ọrịa a (Surveillance and Epidemiological Investigation).
Mba Chaịna gosiri na mberede nyịri dika mana ọ bụ mberede ka eji ama dike kamgbe ọrịa coronavirus malitere ịkpa ike na mba ahụ
Orịa a malitere na mpaghara Wuhan egbuola ihe karịri otu puku mmadụ ebe ihe karịri mmadụ puku iri anọ bu ya ugbua.
Otu ahụike mbaụwa bụ W.H.O ekwupụtala ọrịa coronavirus dịka nke gbatagbata.
Anwụchiela onyeagha gburu ọchụ gbaa ọsọ

Ebe foto si, AFP/Getty Images
A nwụchiela onye agha Naijira riri mbọmbọ ọso dịka atụrụ ya nga afọ iri maka ọnwụ Lance Corporal Benjamin Collins.
Anwụchịrị onye agha a bụ Major Akeem Oseni n'ọdọ ụgbọelu Cotonu dịka ọ chọrọ ịsi ebe ahụ gbaga mba Amerịka.
N'Ofesi

Ebe foto si, Getty Images
N'akụkọ yiri ibe ya si ofesi na-ekwu na ndị mba Chaịna ji iwe chụpụ n'ọchịchi ndị isi ngalaba dị iche iche na-ahụ maka ịchụpụ ya bụ ọrịa corona.
Dịka ọ dị ụgbụa, mmadụ puku anọ na abụọ na narị asaa na abụọ bu ya bụ ọrịa ebe ihe karịrị otu puku mmadụ anwụọla site n'ọrịa corona na Chaịna.
Joseph Shabalala

Ebe foto si, Getty Images
Onye oti egwu ama ama bụ Jospeh Shabalala bụ onyeisi otu egwu Ladysmith Black Mambazo anwụọla.
Ọ gbara afọ iri asaa na asatọ mgbe ọ nwụrụ.
Ighalo ebughị coronavirus

Ebe foto si, Getty Images
A sị kwa na nkwụcha abụrụ ụjọ dịka nyocha na mkpọpụ emere Odion Ighalo maka Corona Virus gosiri na ọnweghị ya bụ ọrịa.
Ighalo onye si otu Shenshua nke Chaịna were gaa ManUtd ga-eso ha gbaa asọmpị Europa League mgbe ha ga-ezute otu Burges n'ụbọchi iri abụọ nke ọnwa Febuarị na Belgium.









