Amotekun: Ihe o jiri dị iche na Forest Guards ndị ọwụwa anyanwụ

Otu nchekwa ndị

Ebe foto si, Twitter

Gọvanọ ise na-achị mpaghara ọwụwa anyanwụ Naijira - Enugwu, Anambara, Imo, Abia na Ebonyi - ekwenyela n'atụmatụ 'community policing' maka nchekwa ndụ na akụnuba.

Onyeisi ha bụ David Umahi kwuru nke a n'Enugwu oge ha na onyeisi ndị uweojii bụ IGP Mohammed Adamu nwere ọgbakọ nchekwa n'Enugwu.

Ọgbakọ a na-abịa dịka ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ kpebiri ihibe otu nchekwa nke ha.

Mpaghara dị icheiche na Naịjirịa malịtere inwe otu nche nke aka ha n'ihi ogbugbu mmadụ, ntọrị na izu ohi nke dịka ọ na-akawanye njọ.

Ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ na onyeisi ndị uweojii

Ebe foto si, Facebook/Ugwuanyi News Update

Ndị mpaghara ọdịda anyanwụ hibere otu nche nke ha a kpọrọ Amotekun n'ọnwa Janụwarị.

Mana atụmatụ community policing na Amotekun abụghị otu ihe.

Ihe dị iche na ha abụọ bụ:

N'okwu ya n'ọgbakọ ahụ, David Umahi kwuru na atụmatụ 'community policing' adịghị iche na atụmatụ ndị ọzọ ndị gọvanọ hibere maka nchekwa.

Atụmatụ ndị ahụ gụnyere 'neighbourhood watch', 'vigilante operation' na 'forests guard'.

E nwekwara kọmiti ndị gọvanọ ahụ hibere maka ileba anya na nsogbu ndị ọchịehi na ndị ọrụ ugbo na-enwe.

Umahi kwuru sị: "Mgbe anyị hụrụ na atụmatụ ndị uweojii yitere nke anyị na-emebu kemgbe, anyị nabatara ya."

Onyeisi ndị uweojii bụ Mohammed Adamu toro ndị gọvanọ ọwụwa anyanwụ maka ịnaba atụmatụ ya.

Adamu kwekwara nkwa na atụmatụ 'community policing' ga ewulite ọnọdụ nchekwa na mpaghara ọwụwa anyanwụ.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị:

Ihe nkiri ga-amasi gị:

Aha onyonyo, Ọgba mbọ: "Ihe niile nwoke na-eme nwaanyị ga-eme ya karịa"