Burna Boy ọ bụ ọkachamara ịgụ egwu na Naịjirịa?

Ebe foto si, Twitter
- Onye dere ya, Chiagozie Nwonwu
- Ndị mere akụkọ a, BBC Igbo
- Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4
A bịa na ndị na-eti egwu na Naịjirịa ugbua, onye aha ya na-ada ụda karịsịa bụ Burna Boy.
Dịka ọ ka sị na njem isonye ndị a hopụtara maka nturugo 'Grammy' lọta, Burna Boy kwuru na ọ bụ ya bụ ọkachamara ikụ egwu kemgbe Fela Kuti.
Ọ bụ n'akara Twitter ya ka o dere ihe a:
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Ka ude ihe o kwuru ka na abawanye, Burna Boy kwukwara na onweghi onye ziri ya ụzọ n'itiegwu.
Dịka a ma na ọ ga-eme, okwu ya nwuru ọkụ na Twitter ebe ọtụtụ mmadụ foro ntụtụ taa na nwaamadị ahụ tara anụ karịrị ọnụ ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2

End of X post, 3
Mana, n'ime okwu a, onwekara ndị si na Burna Boy tozuru aha ọ chọrọ ka a na-etu ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 4
Onye bụ Burna Boy?

Ebe foto si, Getty Images
Ọ bụ n'afọ 1991 ka a mụrụ Damini Ebunoluwa Ogulu e ji Burna Boy mara na Pọt Hacọt dị na River steeti.
Nna ochie Burna Boy bụ Benson Idonije bụbụ onye na-ahịrị otiegwu Fela Kuti ihe.
Ọ bụ n'afọ 2012 ka egwu Burna Boy tiri akpọrọ Like to Party wuru ọfụma were mee ka ndị mmadụ mata ya ọfụma.
N'oge ahụ, ọ bụ ụlọ ọrụ egwu Aristokrat Records ka Burna Boy na-agụ egwu n'ogige ha.
N'afọ 2017 Burna Boy wetere ohere isonye ụlọ ọrụ egwu na mba Amerịka akpọrọ Bad Habit/Atlantic Records nakwa Wrner Music Group - bụ ndi ga-elekọta anya ya na mba ụwa niile.
Gịnị jikọrọ ya na Fela?

Ebe foto si, Getty Images
Dịka anyị kwuru mbụ, nna ochie ya na Fela rụkọrọ ọrụ
Ọtụtụ egwu Burna Boy bụkwa nkụgharị maọbụ nwere atumatụ egwu Fela kụrụ mbụ.
N'afọ 2013, n'oge Burna Boy ka na-aligote n'iti egwu Naịjirịa, ọ gara emume ncheta Fela akpọrọ Felabration mee ihe tụrụ ndị mmadu na-anya site n'iyi ibante guo egwu dịka Fela.
N'oge ahụ, nwa Fela bụ Seun Kuti gbarụru ihu maka ihe Burna Boy mere site n'ikwu na ọbụghi etu a ka nna ya si agụ egwu.
Ọ bụ ya kacha mara agụ egwu na Naịjirịa?

Burna boy abụghị onye eji ijide ọnụ ya aka mara dịka o mere ka ndị na-ahazi emume Coachela mara oge ọ sị na edighi aha ya ọfuma oge ha kpọro ya ka ọ bịa.
Gụọ maka akụkọ ahụ ebe a: Ndị otiegwu Naịjirịa ga-apụta na Coachella.
Eziokwu bụ na mba ụwa ugbua, onweghi onye otiegwu Naijirịa na-ewu karịa nwaamadị a.
Ọkachasị ya bụrụ na ọ bụ afọ 2019 bata 2020 ka a na-ekwu okwu ya.
Ọ bụ n'afọ 2019 ka oritere nturu ugo a kpọrọ "Best International Act" n'ogige "BET Awards".
Ọ pụtakwara ka onye ụlọọrụ Apple Music kpọrọ "Next Up Artist".
Efele egwu nke anọ etiputara ritekwere ntụ ugo a kpọrọ "Album of the Year" n'ogige "All Africa Music Awards" ma nwetekwa ohere iso zọọ ntụ ugo Grammy nke 2020.
Agbenyeghị ike a niile Burna Boy kpara, ọ bụghị ya ka akacha ekiri ihe nkiri eguw ya na Youtube.
Onye tụ ugo ahu bụ Davido, Ebe Sinach, Yemi Alade, Tekno na PSquare na-eso ya n'azụ.
Etu egwu 7 akachasị ekiri ihe nkiri ha siri kwụrụ n'ụtụtụ 13-02-2020:
- Davido "Fall" = Nde 157
- Sinach "Way Maker" = Nde 140
- Yemi Alade "Johnny = Nde 133
- Tekno "Pana" = Nde 120
- Runtown "Mad Over You" = Nde 100
- Davido "I" = Nde 100
- PSquare "Personally" = Nde 96
Egwu Burna Boy gbagotere bụ "On the Low" mmadụ nde 96 kirigoro na 'youtube'.
Nke a pụtara na ya na nke PSquare gbara nhatanha.
Anyị aghaghi ekwu na ọ bụ Burna Boy kachasị agụ egwu, maọbu na o bu ya kachasị kemgbe Fela Kuti.
N'otu aka ahụ, anyi aghaghịkwanụ asị o bụ Fela kachasị agụ egwu kemgbe egwu malitere na Naịjirịa makana egwu bụ na ntị onye.
Nke bu eziokwu bu na Burna Boy na-anwa ọfụma.
Ndi ọzo na-anwakwa nke ha.

Akụkọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị: