George Obiozor na Ohaneze Ndigbo enweghị ikike ikwuru ndị Igbo maka Biafra - Paul Achalla

Aha onyonyo, Paul Achalla

Paul Achalla akatọọla okwu George Obiozor bụ onyeisi Ohaneze Ndigbo kwuru gbasara Biafra.

Obiozor kwuru na ndị Igbo anaghị achọ isi na Naịjirịa pụọ n'ihi na onweghị ihe na-esere ndị Igbo na Naịjirịa.

Aha onyonyo, George Obiozor: Nnamdi Kanu bụ nwa anyị, okwu Biafra abụghị okwu ụmụntakịrị

Mana Paul Achalla, onye ọkaiwu ma bụrụkwa onye nkwado otu nwereonwe Biafra bụ IPOB kwuru na Obiozor enweghị ikike ikwuchitere ndị Igbo niile ọnụ ha.

Paul Achalla kwuru na tupu enwee mkpebi ọbụla gbasara Biafra, ndị Igbo niile ga-ekwekọrịta site na ntuliaka nke a kpọrọ referendum.

Gere ihe o kwuru.