Paris Waiter Murder: N'ihi ebuteghi nri n'oge ka mmadụ jiri gbuo mmadụ ibe ya
Akụkọ kachasị taa:

Ebe foto si, AFP
Onweghi ihe mmadụ agaghị anụzi ugbu a o.
Otu nwoke agbagbuola onye na-enye aka n'ụlọ ebe a na-ere nri na France n'ihi na o buteghiri ya nri ya n'oge?
Nke a mere na mpaghara Noisy-le-Grand nke dị nso n'obodo Paris, isi obodo France.
Nwoke kpara arụ a riri mbọmbọ ọsọ mana ndị uweojii obodo Paris ekwuola na aka ga-akpara ya n'oge na-adịghị anya.
Big Brother Naija

Ebe foto si, Twitter/@BBNaija
Agbaarala Joe na Enkay ụgbọnwamkpi n'egwuregwu Big Brother Naija nke afọ 2019.
Joe, onye ezigbo aha ya bụ Joseph Abdallah, na Enkay, onye aha ya bụ Ede Nkechinyere, bụ ha nwetara vootu kacha nta n'egwuregwu ahụ n'izuuka gara aga.
Ndị fọziri n'egwuregwu a ugbua bụ Tacha, Omashola, Ike, Cindy, Khafi, Elozonam, na Frodd.
Nnyocha ọchịchị Obasanjo

Ebe foto si, Serap Nigeria/Facebook
Otu a kpọrọ "Socio-Economic Rights and Accountability Project" maọbụ SERAP n'aha ịchafụ ekwuola na ha nabatara atụmatụ ndị EFCC wepụtara iji nyochaa ijeri dollar iri na isii bụ nke e kwuru na aka chiburu Naijiria bụ Olusegun Obasanjo tinyere n'ihe gbasara ọkụ latrik.
SERAP kwuru na nke ahụ ga-egosi na n'eziokwu, iwu obodo Naijiria anaghị asọ mmadụ ọbụla anya.
Oteela aka ebidoro kwube na Obasanjo mere nrụrụaka n'ihe gbasara ọkụ latrik oge ọ nọ n'ọchịchị.
Mana onwebeghi mgbe a kpụpụrụ ya n'ụlọ ikpe maka ya.
Ihe mere Ekweremadụ ga eme ndị ọsọ - Nnamdi Kanu

Ebe foto si, Getty Images
Onye ndu otu ndị Ipob bụ NnamdI Kanu akwadoola mwakpo ndị otu ya wakporo Ike Ekweremadu na mba Jamanị ma kwuo na otua ka ha ga-naeme ndị ọchịchị ala Igbo niile.
Kanu kwuru nke a site n'akara Twitter ya n'ụtụ Sọnde.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Mana Ekweremadụ n'onwe ya eweputala akụwkọ ozi na-ekwu na ya emerụghị ahụ ọbụla na mwakpo ahụ.
O kwukwara na ya agbaala mkpesa n'aka ndị uweojii mba Jamanị, nakwa n'aka onye nnọchite obodo Naijiria n'ebe ahụ.
Ekweremadu gakwara n'ihu kwuo na ọ gbagharala ndị niile kpasoro ya agwa ọjọọ a n'ihi na ha amaghị ihe ha na-eme.
Ashley Cole apịnyụọla ọkụ

Ebe foto si, Chelsea FC
N'egwuregwu, ọgba bọọlụ mba England bụ Ashley Cole apịnyụọla ọkụ n'igba bọọlụ taa ma kwuo na ya ga-elebazi anya n'ihe gbasara nkụzi bọọlụ.
Asley Cole onye gbara afọ iri atọ na asatọ tutere ọtụtụ ugo oge ọ nọ n'egwu nke gunyere, iko Champions League, Europa cup, Premier League nakwa FA cup.
Cole gbakwaara ọtụtụ otu bọọlụ ama ama n'akụkụ ụwa nile dịka Arsenal, Chelsea, AS Roma (Italy), LA Galaxy (Amerịka) na Derby County.
Akụkọ ndị-ọzọ ga-amasị gị:











