Traffic Jam: Etu ị ga-esi gbalarị kpachi kpachi okporoụzọ

Okporo ụzọ

Ebe foto si, Getty Images

Anyị agbachaala ihe niile a na-agba agba, ọrụ ebidola.

Eziokwu bu na ọrụ bidoro kemgbe abalị abụọ ọnwa Jenuwarị a, mana ọ bụ taa bụ ụbọchị nke asaa n'ọnwa Janụwarị ka ụmụakwụkwọ bidoro.

Ya bụ na okporoụzọ abụghịzi siriri werere ka o si dịbu mgbe ọtụtụ mmadụ nọ n'obodo ha enwe aṅụrị ekeresimesi.

Okporoụzọ ebidola kwowe ekwo, onye ọbụla chọrọ iru ụlọọrụ n'otu oge.

Anyị sị ka anyị tụnye ndị be anyị azụ etu ha nwere ike isi were gbalarị kpachi kpachi okporoụzọ.

Zụta ihe mgbaama, gbaa mbọ hụ na ị tetara ma ọ kụwa

Mgba ama

Ebe foto si, Getty Images

Oge ruo ya tiwe mkpu, i bilie n'ụra.

Agwala onwe gị ka ịrahụtụkwuo ntakịrị.

Ọrụ gbasaa, chere ka kpachi kpachi belata n'okporoụzọ

Office

Ebe foto si, Getty Images

Ya bụrụ na ụloọrụ gị ga-ekwe, chere ka kpachi kpachi ụzọ belata.

Ịnọ n'ụlọọrụ mee ihe bara uru ka mma karịa ịnọ n'ụzọ kpọchiri akpọchi.

Jiri gbọ mmiri were gaa ma laa ọrụ

Ụgbọ mmiri

Ebe foto si, Getty Images

Ọtụtụ ndị mmadụ amaghị na ụgbọ mmiri na-aga ebe dị icheiche.

Kpachi kpachi adịghị na mmiri dị ka n'okporoụzọ.

Ọ bụrụ na mmiri dị n'ogbe gị, banye ụgbọ mmiri, ma gbaa mbọ hụ na iyi uwe ndụ oge niile.

Kwadobe nkwado n'ụgbọala

Ntecha

Ebe foto si, Getty Images

Ọbụrụ na ọ bụ gị na-anya ụgbọala, biko leghara nke a.

Kwara ụmụ ngwongwo gị dịka akpụkpọụkwụ, ọla, ntecha, na ihe ndị ọzọ, ị banye n'ụgbọala, i bido mewe ihe ndị a ka i were gaa n'oge.

Gaa lee ihe nkiri na sinima dị ụlọọrụ gị nso

Sinema

Ebe foto si, Getty Images

Ihe sinima bụ ezi ebe i nwere ike igbu oge.

Legharia anya, gaa n'ụlọahịa dịgasị n'okirikiri ebe ahụ were anya gị gbaara onwe gị ekeresimesi.

Chọrọ ihe nkiri masịrị gị, kiribe ya, ọ ka mma.

Hie n'ụlọ enyi gị bi nso n'ụlọọrụ gị

Ndị ọyị

Ebe foto si, Getty Images

Ọbụrụ na ebe i bi dị anya, chọọ enyi gị bi nso, hie na be ya.

I nwere ike ịlaghachi ụlọ nke gị na ngwusị izu.

Chọta ụlọ n'ebe dị nso ụlọọrụ gị

Ụlọ

Ebe foto si, Getty Images

I nwere ike sị na nke a ga adị oke ọnụ mana ị chemie ya echemi, ị hụ na n'ikpeazụ ọ kaara gị mma.

Ị ga-echekwa ego gị ma i mee etu a.

N'ihe ndi a niile, ihe kachasị mkpa bụ nchekwa gị, gbaa mbọ hụ na ụzọ ọbụla i soro, na ị chekwabara onwe gị nke ọma.

Akụkọ ga-amasị gị: