Etu ụmụnwaanyị ga-esi jiri obere ego na-egbuke ka ọnwa

Ebe foto si, Getty Images
Agbachaala ekeresimesi, chụọ afọ, anyị nọzị n'afọ ọhụrụ.
Ihe ndị a niile bụ ego ka e ji were gbaa ha.
Ọtụtụ ndị mmadụ, ihe fọdụzịrị n'akpa ụlọakụ ha adịghị agwa ha ezịokwu.
Mana, ọbụghị ya kpatazịrị na anyị agaghị adị ka anyi chọrọ, nke bụ ịdị mma n'anya.
Onye na ahazi ejiji bụ Nkeiruka Ifeonu agwala BBC Igbo etu anyị nwere ike isi were hazie onwe anyị, na agbanyeghị ihe akpa anyị n'ekwu.
Zụta akwa ya na ọtụtụ akwa ga-aganwu

Ebe foto si, Chimamanda_Adichie/Instagram
Onye ọbụla nwere otu akwa ahụ dị na akpati ya eyibeghi maka na ahụbeghị akwa ya na ya ga-agakọ.
Gote nke dị mfe ka inwee ike jiri ya yiri akwa dị icheiche.
Lee akwa n'ọkịrịka anya ọzọ

Ebe foto si, Getty Images
Ọ dị egwu ụdị ọmalịcha uwe ị ga-ahụ n'ahịa okịrịka.
Ụfọdụ na eme ihere, mana onweghị ihe ihere dị n'izụta akwa n'ọkịrịka. N'Ofesi, Bekee kpọrọ ya "thrifting".
Ndị be anyị na-akpọkwa ya 'bend down select', ya bụ ukwu ruo gi ala ka ị na-achọpụta akwa masịrị gị n'ọdụ ọkịrịka.
Ejila ego ole akwa bụ were zụta ya

Ebe foto si, Getty Images
Ọnwere ndị bụ na ọbụrụ na akwa agaghị ọnụ, ha agaghị azụta ya
Na akwa ịdị ọnụ apụtaghị na ọbụ ezi akwa. Na akawa di ọnu ala n'onwe ya abụghị na ọ bu adịgoloja. Nke bụ eziokwu bụ na ị ga-ele akwa ị na-azụ anya, ịhụ na ọ di mma were zụta ya n'agbanyeghị na ọnụ etinyere na ya abụghị ga-agbaka akpati ego gị.
E nwere ezi akwa na ndị adighị ọnụ

Ebe foto si, Getty Images
Jiri uche were yiri akwa gị

Ebe foto si, Getty Images
Iyiri akwa taa were chọọ iyi ya ụbochị ọzọ, jiri akwa dị iche na nke ijibu na mbụ were yie ya. Maọbụ hazie ya etu dị iche, dị ka itinye uwe elu gị n'ime traụza gị ka ọ dị ụtọ n'anya.
Were ọla dị iche iche kwalite akwa gị

Ebe foto si, Getty Images
I nwere ike iyi akwa iyigoro oge ole ma ole, mana ijiri ihe dị ka ịchafụ, maọbụ iyorintị na-achapụ achapụ, ihụ na ihe dị iche ga adị.
Ifeonu kwukwara na n'ime ihe niile a, nke kachasị mkpa bụ inwe ntụkwasịobi na onwe gị.
I nwere ike yiri akwa izụtara otu kọbọ, mana ịkwụsie ike, na-aga ka idobere ijeri 30 n'ụlọakụ gị, a ga ele gị anya, jụọ gị ma ọ bụ obodo Paris ka isi zụta akwa iyi.
Ya bụ na ikwesịghị ịkụka ụlọakụ ka ị were dị ka achọọ.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:










