Dino Melaye enyefela ndị uweojii onwe ya

Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu Sineto Dino Melaye na anọchite Kogi n'ụlọomewu enyefela onwe ya ndị uweojii.
Akụkọ kwuru na ndị uweojji kpụrụ ya gawa n'isi ụlọrụ ha dị n'Abuja.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ndị uweojii wakporo ụlọ Melaye dị na Maitama , Abuja abalị asaa gara aga kwechiri, jụ ọpụpụ..
Mbọ Melaye gbara iji sị n'ikike ụlọikpe chụpụ ha kpụrụ afọ n'ala dịka ụlọikpe jụrụ ịza ekpere ya.
Kemgbe abalị ole na ole, Ndị uweojii chọrọ ka Melaye bịa zara ọnụ ya banyere ebubo gbasara ogbugbu mmadụ nakwa ohi.
Akụkọ ka na-abịa.



























