Dino Melaye enyefela ndị uweojii onwe ya

Dino Melaye
Nkọwa foto, Dino Melaye nyefere onwe ya n'aka ndị uweojii ka ọ gachara abali asaa ha wakporo ụlọ ya ma jụụ ọpụpụ
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1

Akụkọ na-eru anyị ntị ugbua na-ekwu Sineto Dino Melaye na anọchite Kogi n'ụlọomewu enyefela onwe ya ndị uweojii.

Akụkọ kwuru na ndị uweojji kpụrụ ya gawa n'isi ụlọrụ ha dị n'Abuja.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Ndị uweojii wakporo ụlọ Melaye dị na Maitama , Abuja abalị asaa gara aga kwechiri, jụ ọpụpụ..

Mbọ Melaye gbara iji sị n'ikike ụlọikpe chụpụ ha kpụrụ afọ n'ala dịka ụlọikpe jụrụ ịza ekpere ya.

Kemgbe abalị ole na ole, Ndị uweojii chọrọ ka Melaye bịa zara ọnụ ya banyere ebubo gbasara ogbugbu mmadụ nakwa ohi.

Akụkọ ka na-abịa.