Dino Melaye: Ndị uweojii achọghị ịpụ n'ụlọ ya na-anwụchighi ya

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Akụkọ dị mkpa:

Dino Melaye na ndị uweojii

Ndị uweojii Naịjirịa ekwuola na ha agaghị esi n'ogige ụlọ Sinetọ Dino Melaye pụọ ma ọ bụghị ma ọ bịara kpesa onwe ya n'aka ha dịka o kwesịrị ime kemgbe.

Dino Melaye

Ebe foto si, Instagram/Dino Melaye

Mana na mkparịtaụka ya na ndị ntaakụkọ Channels TV nwere n'ekwentị, Melaye kwuru na ọ bụghị omempụ, na ọ ga-egosi ndị uweojii onwe ya n'izu na-abịa mgbe ọ batara Abuja.

Cheta na ndị uweojii na-ebo ya ebubo ịma maka ndị omekome gbara otu onye uweojii egbe.

E liela Shagari:

E tinyela ozu aka chịburu Naịjirịa bụ Shehu Shagari n'ala dịka ndị alakụba si eli ozu.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Cheta na Shagari dị afọ iri itoolu na atọ nwụrụ n'ụbọchị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Disemba a, n'ụlọọgwụ dị n'Abuja ka ọ rịachara obere ọrịa oyi ịba n'ahụ a kpọrọ "pneumonia".

Lee foto si n'olili ya:

Ndị agha natara ozu ya
Ebe e liri ya

Gana mere ntuliaka

Onyeisiala ndị mba Gana bụ Nana Akufo-Addo etoola ndị isioche ụlọorụ ntuliaka ha maka mbọ ha gbara ịhụ na usoro ndị mmadụ binyere aka n'akwụkwọ ga-eme ka ekewapụta mpaghara ọhụrụ, gara were were.

N'egwuregwu,

Cristiano Ronaldo nyere goolu abụọ mere ka Juventus merie Sampdoria.

C Ronaldo

Ebe foto si, Getty Images

Goolu a butere ole o nyere n'afọ 2018 a na iri anọ na itoolu, nke bụ mbụ ọ na-enyerughi goolu iri ise n'ime afọ asatọ gara aga.

Egwu Eke nke atọ

Ụfọdụ ụmụ Naịjirịa akatọọla egwueke nke atọ ndị agha Naịjirịa kwuru na ha ga-amalite n'akụkụ Naịjirịa niile ka ha jikere maka nsogbu ọ bụla nwerike ipụta mgbe a na-akwado, mgbe a na-eme maọbụ mmecha ntuliaka 2019 na-abịanụ.

Ndị agha

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị agha Naịjirịa na-adị njikere maka Egwu Eke atọ

Onyeisi ndị agha Naịjirịa bụ Tukur Buratai, kwuru na egwu eke atọ ga-ebido n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Jenụwarị ma kwụsị n'ụbọchị iri abụọ na asatọ nke ọnwa Febrụwarị.

Ndị agha Naịjirịa kwuru maka ya bụ Egwu Eke na Twitter:‏

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Lee ihe ha kwuru na Twitter

@JabeerJaiz kwuru na ọ na-atụ anya na ya bụ emume ga-aga nkeọma

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Ebe ụfọdụ ụmụ Igbo na-ekwu na ọ bụ maka ndị Biafra ka gọọmenti ji ehibe ya bụ "Egwu Eke atọ"

Skip X post, 4
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 4

@Michaelche4 kwuru na ya bụ atụmaatụ bụ iji memina ụmụ Naịjịrịa.

Skip X post, 5
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 5

N'akụkọ ọzọ,

Ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, APC napụrụ PDP ọchịchị n'afọ 2015

Ndị otu pati All progressives progressives akpọrọ APC n'ichafu site n'ọnụ na-ekwuchitere ha bụ Lanre Issa-Onilu ndị na-ekwuru ha etiela pati PDP aka n'obi.

Ọ bụ maka ụfọdụ ndị otu ha nwụrụnụ na mberede okporoụzọ mgbe ha gara i so onye otu ha na-azọ oche sineti na Benue steeti achụ nta vootu.

N'ọnụ ha, anyị bụ ndị otu pati APC nwere mgbawa obi maka ihe mberede a mere ndị otu pati PDP, n'ekpekwa ekpere ka Chukwu nọnyere ndị bee ihe a mere.

Ndị otu APC na-arịọkwa dịka emume ndọrọndọrọ ọchịchị gbagotere, ka ndị ọrụ nchekwa na ọrụ na-ahụ njem okporoụzọ kpachapụ anya hụ na emume ndị a enweghị ọdachị ọ bụla.

Ndị na-eme ngagharị
Nkọwa foto, Ọ bụghị mbụ ana-atọ ndị ụkọchukwu Katọlik

Ndị uweojii nọ na Anambara ekwuola na ha azọpụtala ụkọchukwu Katọlik abuọ ndị ntọ tọrọla ụbọchị iri abụọ nke ọnwa Disemba 2018.

N'ime akwụkwọ ozi onụ na-ekwuchitere ha bụ Haruna Mohammed degara ndị ntaakụkọ, ha kwuru na njikọta aka ha na ngalaba uweojii ndị ọzọ dị na steeti ahụ

mere ka azọpụta ndị ụkọchukwu ahụ ndị ntọ tọrọ.

Ndị Uweojii na Dino Melaye

Ibrahim Idris na Dino Melaye

Ebe foto si, GETTY IMAGES/DINO MELAYE

Nkọwa foto, Ibrahim Idris na Dino Melaye bụ Sinetọ na-anọchite anya ndị Kogi West na-akwata ya maka ebubo mmadụ abụọ ndị uweojii nwụchiri boro ya

Anyị agaghị apụ na bee ya maọbụrụ na anyị anwụchịghị ya.

Ọ bụ ndị ụweojii gbara ụlọ Abuja onye na-anọchite anya ọdịda anyanwụ Kogi steeti n'ụlọomeiwu bụ Dino Melaye kwuru nkea.

Tupu ugbua, ndị uweojii kpọpụrụ Melaye n'ụlọikpe maka ebubo na ha nwetara ngwọagha n'aka ya.

Mana Dino Melaye agwaala ndị ntaakụkọ "Channels" na ya anaghị agba ọsọ kama na ya ga-ewere onwe ya nye n'aka ndị uweojii n'izu ụka na-abịanụ.

N'Egwuregwu,

Arsenal/Liverpool

Ebe foto si, Getty Images

Ndị egwuregwu bọọlụ na-amasị adịla njikere maka ị mata Mbe nabụ nke bụ oke n'etiti Liverpool na Arsenal na mgbede taa bụ ụbọchi iri abụọ na itoolu nke ọnwa Disemba 2018 n'asọmpị Premier League.

Liverpool emeriela asọmpị iri na isii n'ime iri na itoolu ha gbagoro kamgbe a malitere asọmpi Premiere League nke izu a.

N'Ofesi,

Egypt

Ebe foto si, Reuters

Nkọwa foto, Ndị uweojii na-enyocha ya bụ ụgbọala gbatọsiri agbatọ

Ọgbunigwe gbara n'okporoụzọ agbagbuola mmadụ anọ ma merụọ mmadụ iri na abụọ nọ n'ime ụgbọala na Giza Pyramids dị na mba Egypt,

ndị ọrụ gọọmenti ekwuputala.

E zoro ya bụ ogbunigwe n'akụkụ mgbidi tupu ọgba mgbe ndị a na-agba n'okporoụzọ.

Nkeji Ututu

Aha nkeananụānụ, Akụkọ ga-amasị gị ị ga-achọ ikọ taa niile

Ihe nkiri taa

Aha onyonyo, 'Ihe dị iche na Ezeigbo na Igwe maọbụ Eze'