Caruana Galizia Murder: Ịgba mbọ ka nne m e gburu nweta ikpe ziri ezi'

Ebe foto si, Reuters
Otu ugboro n'ime ọnwa ole na ole, mụ na onye na-enyocha ọnwụ nne m na-anọ n'imeụlọ enwe nzụkọ.
Ezinaụlọ m hụrụ ya mbụ afọ isii gara aga mgbe ọ bịara be anyị ịnwuchi nne m.
Nne m biputara akwụkwọ ozi nke na-akatọ otu onye n'ime ndị na-azọ ọkwa Praim Minista ụbọchị ntuliaka.
Nke a mere na otu n'ime ndị nso ya kpọọrọ nne m ndị uweojii.
Nwoke ahụ bịara ịnwụchi nne m n'etiti abalị na ọ dara iwu "illegal expression".
Anọ m ọrụ na mpaghara ọzọ n'ụwa mana ndị mmadụ na-ezitere m ihe onyonyo ebe a tọghapụrụ nne m ebe elekere 1:30 nke ụzụ ụtụtụ.
Ka elekere ole na ole gachara, ọ laghachi na websaịt ya na-ede maka ahụhụ ọ tara n'aka ndị uweojii ma na-amakwa Prịam Minista ọhụrụ na onwe ya njakịrị.
O dere sị, "Iwe ụnụ adịla ọkụ maka etu m dị mana mgbe ndị uweojii bịara be gị ịnwụchi gị n'abali, ike ekike na ite techa techa ga-abụ ihe ikpeazụ na-eche gị."
Ugbua, nwoke ahụ bịara ịnwụchi ya bụzi onye na-edu nnyocha banyere ọnwụ ya.

Ebe foto si, Getty Images
Ụbọchị e gburu nne m, ọ gara ụlọakụ ịnata ikike obaego ya nke onye mịnịsta gọọmentị nyere iwu ka a napụ ya.
Ọ ka gbachara afọ 53 ma nọrọ n'ogogo dị elu n'ọrụ mgbasa ozi nke ọ rụọlara afọ 30.
Ọkara otu kilogram ogbunigwe e zoro n'okpuru ụgbọala ya gbagburu ya.
Ndị na-akwado gọọmentị ṅụrịrị ọṅụ maka ọnwụ ya na-ezoghi ọnụ ha ezo nke chetara m ndị ṅụrịrị na mgbagbu a gbagburu onye ntaakụkọ Hrant Dink nke mba Turkey na Amernia.
Ụfọdụ ndị osu imi sị na ọ bụ m kpara nkata igbu nne m maọbụ na ọ bụ nne m tinyere onwe ya na nsogbo, dịka ụfọdụ siri kwuo mgbe a tọrọ ma gbuo onye ntaakụkọ Amerịka bụ James Foley na Syria.na

- Oktoba afọ 2017: Ogbunigwe ụgbọala gburu onyentaakụkọ nnyocha bụ Daphne Caruana Galizia.
- Praim Minista Joseph Muscat kpọrọ ogbugbu ya dịka "ihe bụ arụ"
- Ezinaụlọ ya gbochiri ndị gọọmentị ịbịa na akwamozu ya.
- Disemba afọ 2017: A nwụchiri ụmụnwoke atọ ebe ndị uweojii na-enyocha ma e gobiri ndị omekome gburu ya.
- Julaị afọ 2018: Ụlọikpe pụrụ iche kwuru na ikpe amaghị Praim Minista na nwunye ya gbasara ebubo nrụrụaka Daphne Caruana Galizia boro ha.
- Ọgọst afọ 2018: Ezinaụlọ Daphne Caruana Galizia chọrọ nnyocha zuru oke nke ọha iji maata ma mba Malta enwere ike igbochi ọnwụ ya.

Gịnị mere ogbugbu ndị a jiri dị mkpa?
Ihe nwanne m nwoke gwara ndị ndọrọndọro mba Yurop mgbe anyị ka na-eru ụjụ bụ na "Ohere mgbasa ozi, uche onye nke bụ ọrụ ndị ntaakụkọ na-eme ka e nwee ikpemkwụmọtọ na nhatanha na-achị".
"Ọ na-eme ka e nwee obodo nwere akụ, kwudosie ike, obodo ebe dị mma obibi."
Mgbe e gbuchara nne anyị, ihe nyere anyị ike bụ nkwado pụrụ iche nakwa ozi iti aka n'obi nke si n'aka ndị dị iche iche.
Ọ tụrụ m n'anya ma chetara m ihe enyi m gwara m n'oge gara aga: Ndị ọma nọ ebe niile. Ihe fọrọ bụ ịchọpụta ha."
Ọrụ mụ,nwanne m nwoke na nna m wepụtara onwe anyị kemgbe e gburu nne anyị bụ inweta ikpemkwụmọtọ maka ọnwụ ya, maka ọrụ ya nakwa ịhụ na ụdịrị ihe a emeghi ọzọ.
Anyị enweghizi oge maka ihe ọbụla.

Ebe foto si, Getty Images
N'ezinaụlọ m ụfọdụ oge, anyị na-akpa maka etu ndị nọ n'ọchịchị si gbakọta anyị azụ maọbụ gbachi nkịtị.
Ụmụ onye ntaakụkọ mba Turkey bụ Ugur Mumcu gwara m na mgbe nna ya nwụchara n'ogbunigwe ụgbọala, onyeisi ndị uweojii gwara ha na "o nweghi ihe anyị nwereike ị me, mgbidi nọchịrị anyị n'ihu"
Nne ha sara ya sị ya "jiri nwayọọ nwayọọ kwatuo ya bụ mgbidi"
Ihe a ka anyị na-eme kemgbe nne anyị nwụrụ.
Anyị esonyela ndị ọzọ n'iwepu ọrịa "ike agbụ" ma kuzikwara ụwa nille nsọpụrụ ike dịrị onye n'otu aka ahụ.

Ebe foto si, Getty Images
Mwereonwe na-ebido n'echiche" onye odee akwụkwọ bụ Yameen Rasheed gwara anyị tupu asugbuo ya n'ihu ụlọ ya na Maldives n'afọ 2017.
Dịka ọnwụ nne m, ọnwa ya gosiri na enweghi nsọpụrụ maka mmwereonwe na mba ndị ahụ
Ọrụ ukwu adasala anyị n'isi mana anyị agaghị emenwu ya n'onwe anyị
Anyị chọrọ enyemeka ndị ọma niile ebe niile ha nọ.

- World Press Freedom Day bụ ụbọchụ UN kewapụtara n'afọ 1993 nke a na-echeta kwa ụbọchị atọ n'ọnwa Mee.
- Isiokwu nke afọ a bụ ọrụ ntaakụkọ na ntuliaka n'oge akụkọ ụgha.
- Ihe eji wepụta ụbọchị ahụ bụ iji chekwa, nyocha ma lebanye anya n'ọnọdụ mwereonwe akụkọ n'ụwa niile ma kwanyere ndị ntaakụkọ nwụrụ maka ọrụ ha na-arụ
- N'afọ gara aga. Ihe ruru ndị ntaakụkọ 95 nwụrụ site n'ogbugbu, ogbuniwgwe nakwa mgbọ itụ mmadụ dịka ngalaba na-ahụ maka ndị ntaakọ siri kwuo.

Cheta na Jamal Khasoggi bụ nwoke a hụrụ anya n'ụwa niile.
Ọ bụ sọsọ otu mmadụ ahụghị ya n'anya megidere ihe gbuo ya.
N'ime ọnwụ ndị a niile, ihe jịkọrọ ha bụ na o nweghi ihe gọọmentị na-eme iji chọpụta ndị mere ihe a ma maa ha ikpe.

Ebe foto si, Getty Images
Ya mere na anyị ejirila nwaayọ na-ewepu okwute na mgbidi gbochiri ụzọ site n'ịgwa gọọmentị Malta ha mee nyocha pụrụiche n'ọnwụ onye ntaakụkọ dị mkpa.
Mgbe ahụ anyị gazie n'ebe ọzọ.
Ụbọchị ọbụla, ọ na-adị m ka ya bụrụ nne m ejighi ndụ ya chụ aja a.
Mana dịka Khadija Ismailova onye ntaakụkọ mba Azeri nke a kpọrọ nwuchi ya "ihe dị egwu" siri kwuo: "Anyị hụ na anya n'ezie, anyị ga-achọ ka ndị anyị hụrụ n'anya bụ ndị ha bụ. Ya bụ onye Daphne bụ ọnye ọgụ na odogwu.
Ihe nne m agaghị a ma bụ na ọnwụ ya kpalitere mmụọ puku mmadụ ole na ole na mba Malta nakwa ebe ọzọ.
Ọ na-adị m ka ihe ndị a niile emere n'aha ya kpuchiri ụfọdụ ndị ntaakụkọ n'ebe ihe mere nne m dị.











