Ndị ntaakụkọ ụmụnwoke 4 na BBC ekwenyela ka achabie ụgwọọrụ ha

Site na-aka nri elu-Jeremy Vine, John Humphry, Jon Sopel na Huw Edwards kwenyere na nchabi ụgwọ ọrụ ha
Nkọwa foto, Site na-aka nri elu-Jeremy Vine, John Humphry, Jon Sopel na Huw Edwards kwenyere na nchabi ụgwọ ọrụ ha

Ụmunwoke anọ bụ ndị ntaakụkọ BBC ekwenyela ka achabie ụgwọ ọrụ ha site na nyocha emere gbasara ndịche dị n'ụgwọọrụ.

Ndị a bụ Jeremy Vine, John Humphrys, Huw Edwards na Jon Sopel ekwenyela n'usoro ma ọ bụ odoro anya ka ewetụlata ụgwọọrụ ha.

Nke a soro arụkwaghịm n'ọrụ nke Carrie Grace gbara n'ọkwa ya dịka onye editọ ụlọ ọrụ BBC nke mba China, iji gosipụta iwe ya na ndịche n'ụgwọ ọrụ ndị editọ nwoke na Nwanyị.

Aga ewepụta akwụkwọ nyocha ndiiche n'ụgwọ ọrụ nke BBC n'ịzụka ọzọ na-abịa abịa.

Mgbe emere nyocha gbasara egoole BBC na-akwụ ndị ọrụ ya na-agụpụta ntaakụkọ nke karịrị puku pounds otu narị na iri ise

Aha Chris Evans, Sopel, Jeremy Bowen so na-akwụkwọ ahụ ebe aha Gracie na Katya Adler anọghị na ya bụ akwụkwọ.

Amabeghị ego ole aga-ewepụ n'ụgwọ ọrụ.

Onye editọ mgbasa ozi nke BBC bụ Amol Rajan kwuru na ndị a kwenyere na nchabi ụgwọ ọrụ nwetara ezigbo ego n'oge gara-aga.

"Ụwa ahụ agala ugbua ebe ndị ntaakụkọ a ekwetala ka ọkpụrụkpụ ego ha soro ya la"