Lee etu ndị ekpere Adoration Ground si mee ngagharịiwe taa
Ihe onyonyo a na-egosi mgbe ndị gara ekpere Adoration malitere ịme ngagharị iwe n'Enugwu taa.
Iwe ha dịka BBC Igbo si chọpụta bụ maka mmachi amachiri ekpere ahụ ma nke ụbọchị ụka, ụbọchị Wenzde nakwa ịmụ anya abalị.
Cheta na Bishopu nke Enugwu bụ Bishop Onaga bu ụzọ machie ndị ụka Katọlik niile ị ga-ekpere na nke Fr. Mbaka abalị ole na ole gara aga.
Akụkọ bidoro nsogbu a bụ mgbe Mbaka bụrụ Peter Obi ọnụ n'ụka Wenzde ya ọ kara ma kwụọ na ọ gaghị achị Naịjirịa.
Mbaka mechara tụgharịa gozie Obi ma rịọ ya mgbaghara dịka ndị mmadụ were iwe malite ịkatọ ya (Mbaka).
Nke a bụghị mbụ ụkọchukwu ahụ na-ekwu okwu na-ebute akụkọ gbasara ndị ndọrọndọro.
Ndị ekpere 'Adoration' nke Fada Mbaka amalitela ngagharịiwe n'ihi mmachi a machiri ya

Ndị otu ekpere 'Adoration Ministry' nke onyeisi ya bụ ụkọchukwu Katọlik Ejike Mbaka, amalitela ime ngagharịiwe n'ihi mmachi Bishọpụ Enugwu Dayọsis machiri ụkọchukwu a.
Ọtụtụ ndị mmadụ gbakọrọ n'ogige ekpere 'Adoration' n'ụtụtụ taa bụ ụka, jirichaa ahịhịa ndụ n'aka ha ma na-eme ngagharịiwe.
ọtụtụ n'ime ha na-ekwu na ụka Katọlik n'Enugwu steeti enweghị Bishọpụ.
Akụkọ na-abịa.














