'Ọkaikpe nwee obi ebere' - Ihe ụfọdụ kwuru maka ikpe a mara Ekweremadu, nwunye ya
Dịka a mara Ike Ekweremadu na nwunye ya bụ Beatrice ikpe na mba Briten, maka ebubo ịtụ mgbere akụkụ ahụ mmadụ, ụfọdụ ndị mmadụ n'Enugwu steeti na-arịọ ka ọkaikpe ji okwu ahụ nwee obi ebere ma belata aka na ntaramahụhụ ọ ga-enye ha.
Ndị gwara BBC Igbo okwu maka nke a sị na ọ bụ ezie na ekpebiela na Ekweremadu na nwunye ya dara iwu, mana ha na-arịa ọkaikpe ka o nwetụ obi ebere, "maka na ụfọdụ oge, onye na-achọ ịzọpụta ndụ nwa ya, nwere ike mehiee n'usoro o ji achọ ịzọpụta ya," John Ifudu kwuru.
N'otu aka ahụ kwa, Jude Agu, kwuru na ya onwe ya kwenyere na onye mere ihe ọjọọ kwesịrị ka e nye ya ntaramahụhụ, mana ihe ọ na-arịọ bụ ka e balata aka na ya bụ ntaramahụhụ.
Ike Ekweremadu bụ onye ndọrọndọrọ ọchịchị a ma ama na Naịjirịa, onye jirila ọkwa osote onyeisi nke ụlọ omeiwu ukwu bụ Sineti.
Mazi Ifudu dọrọ aka na ntị ka onye ọbụla nọ na mba ofesi na-eso usoro iwu nke mba ọ nọ n'ime ya "ka ụdị ihe a dakwasara Ekweremadu ghara ịdakwasa ya".

Ebe foto si, Met Police
Nwunye ya bụ Beatrice abụchaghị onye a ma ama nke ukwuu, mana ọ bụ onye ọkwa ya gbalitere agbalite n'ụlọọrụ onyeisi mgbakọ ego Naịjirịa a kpọrọ 'Office of the Accountant General of the Federation' na bekee.
Ekweremadu nọ n'ụlọ mkpọrọ kamgbe ndị uweojii nwuchiri ya na nwunye ya n'ọdọ ụgbọelu Heathrow n'ụbọchị 23 nke ọnwa Jun afọ 2022, mana nwunye ya nọtụrụ n'ụlọ mkpọrọ nwa mgbe nta tupu atọhapụ ya ka o si n'ụlọ na-abịa ikpe.
Ndị uweojii UK boro ebubo na Ekweremadu ji ụzọ aghụghọ kpọbata otu nwata nwoke dị afọ 27 na mba ahụ iji were akụrụ ya tinyere nwa ya nwaanyị bụ Sonia, onye nwere ọrịa akuru.
Ọ bụ eziokwu na ụlọikpe ekwuola na ikpe mara Ekweremadu, nwunye ya bụ Beatrice, na otu onye dọkịta aha ya bụ Obinna Obeta, mana amabeghị ihe ntaramahụhụ ha ga-abụ.



