Ike Ekweremadu:Ihe ụmụ Naijiria na-ekwu dịka a tụrụ Ekweremadu mkpọrọ

Ụlọekweremadu n/'Enugwu

Ebe foto si, BBC/Ekweremadu

Ụlọ Ike Ekweremadụ bụbụ Osote Onyeisi Ụlọomeikwu Naijiria n'Enugwu dere jụụ dịka ụlọakwa dịka ụlọikpe mba Briten tụrụ ya mkpọrọ taa bụ Fraide maka ịkpa nkata inara mmadụ akụkọ ahụ ya.

Onye ntaakụkọ anyị gara n'ụlọ ya n'ehihie Fraide dịka a gbara ya ikpe kwuru na ụlọ ya na-ekwobu ekwu tọgbọ na enweghị mmadụ maọbụ ụghara ọbụla dịka karịa ndị nche na-arụ na ya.

Ụlọikpe mba Briten tụrụ Ike Ekweremadu mkpọrọ afọ itoolu na ọnwa asatọ, tụọ nwunye ya mkpọrọ afọ isii, mana e mechara butuo ya ka ọ bụrụzie afọ anọ na ọnwa isii, ebe a tụrụ Dọkịta Obinna Obeta , onye nyere ha aka n'okwu inweta akịrị nwa afọ ọzọ, mkpọrọ afọ iri.

Ozi pụtara taata na ụlọikpe mba Britain atụọla Sinatọ Ike Ekweremmadụ nga afọ iri bụ nke mara ndị madụ jijiji na ahụ na mpaghara Enugwu.

BBC gbara ndị mmadụ ajụjụ ebe ha nọọrọ kwuo na afọ iri buru nnukwu ibu.

Ekweremadụ

Ebe foto si, BBC/Ekweremadu

Mazị Steven Udeh gwara BBC na nwa ya nwoke bụ otu onye na ndị riteworo uru ịgụ akwụkwọ n'efe site na Ikeoha foundation wee kwaa arịrị sị "nga ahụ atụrụ Ekweremmadụ ekwesịghị n'ihi na ọ na enyere ụmụ ogbenye aka"

Ụlọ Ekweremadu n'Enugu

N'ebe ụlọ ya bụ nwamadị dị n'Enugwu, ndị anyị hụrụ ebe ahụ jụrụ ịkwu okwu ganye na onye na ekwuchitere ya ọnụ dịka onye mgbasaozi ewepụta ozi ha.

Kama ha niile nọcha ka ndị n'eru uju.

Mazi Ekechi Odoh bụ onye Mpu gwara anyị n'ekwe nti na nnukwu ọdachị adakwasala ndị be ha n'ihi na Ike Ekweremmadụ bụ otu anya ha ji ahụ ụzọ.

Cheta na ndị Mpu dị n'Okpuru Ọchịchị Aninri LGA nke Enugwu steeti bụ ebe Ekweremmadu si nọ na-ekpere mkpụrụ ụbọchị ole ma ole iji yọọ ka ntaramahụhụ ya belata.

Ihe ụmụ Naijiria na-ekwu maka mkpebi ikpe Ekweremadu

Dịka a tụrụ Ekweremadu mkpọrọ afọ 10 maka ịkpa nkata ịnara otu nwa afọ akịrị ya, nye nwa ya nwere ọrịa akịrị, ụfọdụ ụmụ Naijria gosiri obi omiko n'ọnọdụ chere ya n'ihu.

Senetọ Shehu Sani sịrị, "Chineke nọnyere ha."

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 1

Otu nwaanyị bi n'Ụmụahịa a kpọrọ Gift Igwe kwuru na ya leburu anya na a ga-emere ya ebere hapụ ya, "mana ebe ọ dị otu a, nke a bụ ihe mmụta nye ndị ọzọ ka ha ghara ime ụdị ihe."

Gift Igwe
Nkọwa foto, Gift Igwe: Nke a bụ ihe nkụzị nye ndị ọzọ ka ha ghara ime ụdị ihe."

Ihe ndị kwadoro mkpebi ahụ kwuru

Mana ụfọdụ anaghị emere Ekweremadu ebere.

Dr. Eze Ihechukwumere Ezekiel kwuru na ya bụ ihe ga-eme ka ndị ndọrọndọọ ọchịchị Naijiria mụta akọ.

Ozi Dr. Eze Ihechukwumere Ezekiel

Ebe foto si, Eze Ihechukwumere Ezekiel

Chukwudi Anazodo sịrị, "N'ezie achoro m ka nke a buru nnukwu nkuzi-amamihe nyegara ndi ndu obi ọjọọ nile e nwere n' obodo a, ka ha mata na ugwo-ọrụ diri ihe ọbụla onye metara."

Jack Obiyan kwuru n'akara Facebook ya sị, "Anaghị m emere ndị be Ekweremandụ ebere."

Ihe Jack Obinyan kwuru

Ebe foto si, Jack Obinyan/Facebook

Celeb Critique kwuru na ọ bụrụ na Naijiria ka ikpe ahụ pụtara, na ọ bụ nwata ahụ a chọrọ ịnara akịrị ya ga-anọ na nsogbu.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 2

@Ofidoma kwuru na Gọọmenti Naijiria gaara enye ya ndị ọkaiwu ikwuchitere ya n'ụọikpe kama iziga nanị ozi arịrịọ ka agbaghara ya.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post, 3