Pope Francis eyipụla fada mụtara nwa dị afọ 10 akwa dịka ụkọchukwu

Popu Francis

Ebe foto si, Getty Images

Onyeisi ụka Katolic n’ụwa bụ Popu Francis eyipụla otu ụkọchukwu akwa ụkọchukwu ya maka ịmụta nwa nwoke gbara afọ 10.

Wenceslas Munyeshyaka, gbara afọ 64, onye Rwanda, arụọla ọrụ dịka ụkọchụkwụ na Fransị afọ iri atọ.

Ozi na-efesa n’intanetị nke Bishopụ Evrex binyere aka kwuru na “anapụla ya ikike ịbụ ụkọchukwụ nakwa ime ihe ọbụla dịka ụkọchukwu.”

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: BBC amaghị maka ihe ndị si n'ọbaozi ndị ọzọ.

End of X post

Ụlọọrụ Dayọsis Evreux gwara BBC na ozi ahụ na-efegharị bụ eziokwu dịka ọ gbadoro ụkwụ na iwu nke Popu nyere n’ọnwa Maachị, afọ 2023.

Munyeshyaka, onye si mba Rwanda gbaa ọsọ ndụ oge ọgụ mkpochapụ agbụrụ na Rwanda n’afọ 1994, ekwubeghị ihe ọbụla maka ihe a mere.

A kwụsịrị ya ọrụ n’ike n’ọnwa Disemba afọ 2021 dịka o kwetara na ya bụ nna mụrụ nwa gbara afọ 10.

Ụka Katọlik anaghị enye ndị ụkọchukwu ha ohere ịlụ nwaanyị maọbụ ịmụta nwa.

E chiri Munyeshyaka Fada na Rwanda n’afọ 1992 bụ ebe e boro ya ebubo na aka ya dị n’ogbugbu narị kwuru nari ndị Tutsi gbatara ọsọ ndụ n’ụlọụka ya na Kigali oge ọgụ mkpochapụ agbụrụ.