Agriculture:Ọgwụ eji egbu ahịhịa n'ugbo nwere ike ịbute kansa

Ebe foto si, Getty Images
N'ọnwa Maachi ka ọrụụgbo na-ebiri ọkụ ebe niile n'Alaigbo.
Mgbe dị otu a ka mmiri mbu ji atụ n'ala.
Oge ahụ ruo, ndị ọrụugbo na-amalite ịbọcha ugbo ha maka ịkọ ubi.
Ndị ọrụugbo dị iche iche an eji ụzọ dị iche iche abọcha ahịhịa n'ubi.
Ụfọdụ na-eji aka abọcha ala ha, ebe ụfọdụ na-eji ọgwụ na nma na-egbu ahịhịa tupu ha akọọ okwu.

Ebe foto si, Getty Images
BBC Igbo gbara otu onye ma nke ekwe na-akụ n'ọrụugbo bụ Chukwunonso Agbo ajụjụ ọnụ ịmata ihe ọ dịka ya iji ogwụ gbuo ahịhịa tupu akọwa ugbo.
Agbo sị na " ụfọdụ n'ime ha dị mma. Iji ọgwụ gbụọ ahịhịa n'ugbo adịghị njọ, mana ọ dị mkpa ịmata ka esi etinye ya n'ọrụ. Nsogbu bụ na-ọtụtụ mmadụ amaghị otu esi etinye ya n'ọrụ. Amaghị ihe a bụ ihe na-ebute nsogbu niile so itinye ọgwụ a n'ugbo".
Kedu uru iji ọgwụ gbuo ahịhịa bara?
Ana eji ọgwụ egbu ahịhịa mgbe onye ọrụ ugbo enweghị ike ọ ji abọcha ahịhịa.
Onwekwara ike iji ọgwụ mgbe onweghị ego ọ ga-akwụ ndị ọrụ ga-enyere ya aka ịbọcha ahịa n'ugbo.
Ọ na-enyekwa aka ka onye ọrụugbo ghara itufu mgbe na ike onye ahụ ga-eji rụpụta ihe.

Ebe foto si, Getty Images
Kedu ka esi etinye ọgwụ n'ọrụ ka ọ dị mma?
Agbo kwuru na agbanyeghị na ịjị ọgwụ bọchaa ahịhịa dị mma, na ọ dị mkpa ịmata etụ esi etinye ya n'ọrụ.
Nke agụnyere ịmata ole ekwesiri itinye n'ala ka ọ ghara imebi ihe.
Gee Chukwunonso Agbo ntị n'olu
Kedu ihe ga-eme ma ya bụ ọgwụ karịa n'ala?
Ọ bụrụ na onye ọrụugbo amaghị ọgwu ga-ezu, ọ karịa ya bụ ọgwụ, ọ nwere ike ịmebi ụmụ nje na enyere ala aka.
Nke a ga-eme ka ala ahụ ghara ịmeta nri nke ọma.
Mgbe ụfọdụ ọgwụ ahụ karịa ọnwekwara ike ịbanye n'ime nrị akụrụ n'ubi bụ nke nwere ike ibute ọrịa kansa.













