Ọnụ ahịa osikapa ọ ga-arị ka ọ ga-ada?

Ebe foto si, Getty Images
Okwu gbasara ibubata ahịa iwu osikapa n'ike na Naịjirịa emela gọọmenti ji chọọ imechi oke Naịjirịa na obodo ndị ọzọ, mana amabeghi obodo nke ha ga-emechi oke ha.
Mịnịsịta okwu ọrụ ugbo dị n'aka bụ Audu Ogbeh kwuru na gọọmenti adịla nkwadebe imechi ya bụ oke, o kwuru nke a oge ọ na-agwa ndị ntorobịa ji aha Guardians of the Nationa International bụ (GOTIN) n'aha ịchafụ okwu n'Abuja.
Ogbeh kwuru na mmechi ahụ bụ iji kpalie mmụọ ndị na-akọ osikapa na Naịjirịa ka ha teta n'ụra.
Onye nkwuchiteọnụ mịnịsịtrị ahụ bụ Olukayode Oyeleye gwara BBC na o teela ya bụ okwu oke ala bụ nsogbu mana ha ekwubeghi mba ha ga-emechi oke nke ya.
Mba Kameroon, Bene, Chad na Nijee na Naịjirịa nwere oke ala nke Ogbeh kwuru na otu n'ime ha chọọ ịghasa Naịjirịa.
N'okwu ya; "Nsogbu ọzọ anyị nwere bụ ibubata ahịa iwu. Otu n'ime mba agbata obi anyị na-ebeubata osikapa karịa ihe mba China na-ebubata."
O kwuru; "Ana m agwa unu na mkpụrụ ụbọchị ole na-abịa, unu ga-anụ na anyị emechiela oke anyị."

Ebe foto si, Getty Images
Ha kwuru na ụfọdụ osikapa a na-ebubata na Naịjirịa adịghị mma, ha bụ nsị nwere ike ibute onwu nke bekee kpọrọ acid.
Ogbeh kwuru na gọọmenti ewetuola osikapa mbubata kamgbe afọ abụọ gara aga rue pasentị 95 ma wulite ndị na-akọ osikapa site na nde mmadụ ise rue nde mmadụ 30.
O kwuru na ụfọdụ steeti dịka Anambara, Ebonyi, Kano, Jigawa na Kebbi na-akọ osikapa ebe ọ dị ukwuu.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:









