Ebonyi Property Re-certification: Gọvanọ Umahi sị ka ndị mmadụ bịa natagharị 'C of O' n'Abakaliki

Gọọmentị Ebonyi steeti enyela iwu ka ndị ọbụla nwere ụlọ maọbụ ala n'Abakaliki, isi obodo steeti ahụ were ọsọ bịa denyegharịa aha ha na kọmputa ha zụtara ọhụrụ.
Gọvanọ Dave Umahi bụ ọnye kwuru nke a ka ọ gara ịgbape kọmputa ọhụrụ ọ zụrụ maka nke a sị na ọ dị mkpa na onye ọbụla nwere ala maọbụ ụlọ ga debe aha ha.
Na nkọwa ya, kọmishọna mgbasa ozi dị n'aka bụ Uchenna Orji kwuru na atụmatụ a ga-enye aka ka usoro azụmahịa na mkpata ego malite ị ga were were.
Orji kwuru na atụmatụ a ga-eme ka ihe gbasara okwu ala gbaa n'anwụ nke bụ na onye ọbụla ga-ahụ ya ebe ọbụla onye ahụ nọ n'ụwa.
Ọ sị na nke a ga-eme ka onye ọ bụla chọrọ ịzụ ala mata nke bụ ya na nke abụghị ya maka na aha ndị nwe ala ahụ ga-egosi na kọmputa".
Ọ ga-emekwa ka ndị mmadụ ghara ịgo ala ebe ọwa mmiri kwesiri ịga maọbụ ebe gọọmenti mapụtara maka ọrụ ha.

Ebe foto si, Uchenna Orji
Ya bụ kọmpụta ga-egosikwa ụdị ụlọ ekwesiri ịrụ ebe dị iche iche na isiobodo ahụ.
Orji sị na atụmatụ a "ga-achụpụ ndị omekome na agbaọsọahịa aka n'ọrụ ma mee ka ịzụ ala n'Abakiliki gawa were were".
Nke ka nke bụ na ọ sị na ya bụ atụmatụ ga-emekwa ka gọọmenti nweta ego maka mmepe obodo.
Mgbe anyị juru ego ole a gana akwụ were tinye aha na ya bụ kọmputa, Orji sara na ya amabeghị.
Mana okwusiri ike na ihe a ga-eme ka ndị mmadụ nwee ike ịnweta akwụkwọ ikike ụlọ maọbụ ala bekee kpọrọ "Certificate of Onwership" (C of O) na akwụkwọ ala ndị ọzọ nkwa nkwa.
Ọ sị na nke a ga-enyere ha aka ibita ego n'ụlọakụ ma onye chọọ ime otu ahụ.
Ndị bị n'Abakaliki na-atụ egwu na ihe a bụ ohere gọmenti ji chọọ ị napụ ndị mmadụ ala maọbụ ụlọ ha.
Otu onye na-achọghị ka akpọọ aha ya sị na 'gọọmentị chọrọ iji ụzọ ahụ napụ ndị mmadụ ego".
Ọ rụrụụka na-onweghị ka emecha ihe dị n'ime ya ka ego ghara ịpụ mmadụ n'ahụ.
Ọ sịrị na ọ kwadoghị ya bụ ihe maka anaghị agba aka ahụ nwata eze.
Akụkọ ga-amasị gị










