President Buhari: Gịnị kpatara Buhari anaghị ekpu 'mask'?

Buharị na ndị ọrụ ya

Ebe foto si, Presidency

Nkọwa foto, Buhari anaghị ekpuchi ihu ya ma ya na ndị ọzọ na-enwe nzukọ
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Otu iwu nke gọọmentị etiti tiri iji nye aka n'igbochi mfesa ọrịa coronavirus bụ na onye ọbụla ga na-ekpuchi ihu ya mgbe ọbụla.

Nke a gụnyere mgbe onye ahụ chọrọ ịpụ ezi maọbụ mgbe ya na ndị mmadụ nọ.

Mana onyeisiala Muhammadu Buhari anaghị eme nke a.

Ọtụtụ oge ka onyonyoo Buhari pụtara ebe ya na ndị mmadụ na-eme nzukọ mana ọ gaghị ekpuchi ihu n'agbanyeghi na ndị ọzọ ga-ekpuchicha ihu ha.

Buhari ọ bụzị o tiri iwu ada iwu?

President Buhari

Ebe foto si, Presidency

Nkọwa foto, Oge Buhari nabatara ndị kọmiti o hibere maka ibuso ọrịa coronavirus agha na Naịjirịa

Mana ụlọọrụ onyeisiala akọwaala ụfọdụ ihe mere onyeisiala ejighi ekpuchi ihu ya mgbe ya na ndị ọzọ nwere nzụkọ

Bashir Ahmad bụ onye na-enyere Buhari maka mgbasa ozi soshal midia gwara BBC na onweghi ọrịa ga-efe onyeisiala n'ihi na ndị niile nọ ya n'akụkụ na-ekpuchi ihu ha oge niile.

O kwuru sị: "Nke mbụ bụ na ọbụghị Buhari bụ onyeisiala na-anaghị ekpuchi ihu ya.

TY Danjuma na Buhari

Ebe foto si, Nigeria Presidency

Nkọwa foto, TY Danjuma na Buhari nwere ọgbakọ n'Aso Rock na Mọnde, abalị 18 nke ọnwa Mee 2020

"Ị ga-ahụ na ọtụtụ ndị ọchịchị na mba dị icheiche anaghị ekpuchi ihu ha" ka o kwuru.

"Ọzọ bụ na ebe ọbụla onyeisiala nọ, ị ga-ahụ na onye ọbụla nọdebere ya kpuchiri ihu ha.

"Otu ahụike mbaụwa kwukwara na otu onye nwere ike ịhapụ ikpuchi ihu ya ma ọ bụrụ na ndị niile nọ nso kpuchiri ihu ha."

Onye ọzọ kwa na-arụrụ onyeisiala ọrụ aha ya bụ lauretta Onochie kọwakwara nke a n'akara Twitter ya.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Ndị nkịtị kwanụ?

Onye uweojii na-amanye nwaagbọghọ ka o kpuchie ihu ya

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị uweojii na-amanye ndị mmadụ ka ha kpuchie ihu ha

Ọtụtụ oge ka ndị uwe ojii na ndị ọrụ nchekwa na-enye ndị mmadụ nsogbu maka ekpuchighi ihu.

Oge ụfọdụ, ha na-amanye onye naanị ya nọ n'ime ụgbọala ka o kpuchie ihu, n'agbanyeghi na o nweghi onye ya na ya nọ n'ime ụgbọala ahụ.

Nke a ebutela ọtụtụ nghọtahie n'etiti ndị ọrụ nchekwa na ndị mmadụ nkịtị.

Gịnị ka WHO kwuru gbasara 'face mask'?

Aha onyonyo, Covid-19 n'otu nkeji: Facemask ọ na-egbochi mbute coronavirus?
WHO

Ebe foto si, WHO

Otu 'World Health Organisation' kwuru na ọ dịghị mkpa mmadụ ikpuchi ihu ya ma ọ bụrụ na ahụ siri onye ahụ ike.

Ha kwuru na ndị kwesịrị ikpuchi ihu bụ ndị ahụ adịghị maọbụ ndị na-eleta ndị ọrịa.

Ndị ọchịchị ndị ọzọ na-anaghị ekpuchi ihu ha

Donald Trump na-agwa ndị ntaakụkọ okwu

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Donald Trump anaghị ekpuchi ihu ya

N'ezie, ọ bụghị naanị Buhari bụ onye ọchịchị na-anaghị ekpuchi ihu ya n'ọgbakọ ọha mmadụ.

Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump na osote ya bụ Mike Pence anaghị ekpuchi ha.

Boris Johnson na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'ọnwa March

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Boris Johnson na-agwa ndị ntaakụkọ okwu n'ọnwa March

Boris Johnson, Praịm Mịnịsta mba Briten, bụ onye rịara ọrịa coronavirus ma mechaa gbakee, anaghịkwa ekpuchi ihu.

Onye ọzọkwa bụ Vladmir Putin nke mba Rọshịa.

Mana ị ga-ahụ na ndị niile ha na ha nọ nso anaghị ekpuchikwa ihu ha.

Ugbua, dịka ozi pụtara na osote onyeisiala nke mba Saụt Sudan ebutela ọrịa coronavirus, ndị ọkacha mara na-ekwu na ọ dị mkpa ka onye ọbụla na-echekwa onwe ya nke ọma.