Coronavirus Outbreak: Etu coronavirus si metụta ndụ mmadụ na-abụghị naanị n'ahụike

Nne na nwa na-arịa coronavirus

Ebe foto si, Getty Images

Ọrịa nkuume a kpọrọ Coronavirus nke malitere na mba Chaịna abụghị naanị ahụike ka o metụtara kama ọtụtụ ihe ndị ọzọ na ndụ mmadụ.

Kamgbe ọnwa Disemba 2019 Coronavirus pụtara ihe na mba Chaịna, ọ banyela mba iri atọ nke gunyere Ijipt, Amerịka, Fransị na Briten.

Ihe karịrị mmadụ puku abụọ anwụọla n'ọrịa a ebe mmadụ karịrị puku iri asaa bu ya n'ụwa niile.

Ngalaba ndị ọzọ Coronavirus metụtara

N'agbanyeghi na ọrịa coronavirus matụtara ahụike, e nwere ngalaba ndị ọzọ na ndụ mmadụ ọ na-emetụta n'otu ụzọ maọbụ nke ọzọ.

Akụnaụba

Ọdọ ngwaaghịa

Ebe foto si, Getty Images

Coronavirus emụtala akụnaụba nakwa azụmaahịa ọtụtụ mba ụwa karịsịa ndị ha na Chaịna na-azụkọ ahịa nke Naịjirịa so n'ime ha.

Nke a bụ maka mgbachi ọtụtụ ọdọahịa dị na mba Chaịna iji belata etu ọrịa a si efesasị.

Iji maa atụ; Chaịna bụ mba kachasị azụ mmanụ agbidi n'ụwa niile, mana coronaviru mere ka ha belata aka n'ịzụ mmanụ agbịdị.

N'otu aka ahụ ụlọorụ, Apple na-arụpụta ekwentị Iphone sị na ọrịa emetụtala ego nwete ha.

Egwuregwu

Asọmpi Olympics

Ebe foto si, Getty Images

N'ihi ọrịa coronavirus a kagbuola ọtụtụ asọmpi egwuregwu ehiwere na mpaghara mbaụwa dị iche iche karịsịa na Chaịna.

Egwuregwu ndị a gunyere 'Formulas One-Chinese Grand prix', Asọmpị Golf nke 'HSBC' na-eme maka ụmụnwaanyị, Tenisi, kpọ, Bọọlụ nkata, Họkị, Badmịntịn, egwuregwu ụgbọala (Motorsport) dgz.

Mba Chaịna kagbukwara asọmpi itozuoke n'Olympics Tokyo 2020 ga-adị na Japan mana amabeghi maka nke a ọ ga-eme ka a kagbuo Olympics n'onwe ya.

Agụmakwụkwọ

Ụmụakwụkwọ na Chaịna

Ebe foto si, Getty Images

Kamgbe coronavirus malitere, ọtụtụ ụlọakwụkwọ dị na mba Chaịna agbachiela n'ihi ụjọ ibute nakwa ibufe ọrịa a.

Ọtụtụ ụmụakwụkwọ mba ọzọ gụnyere ndị Naịjirịa, Gana, Kameruun ka tọrọ na mba Chaịna.

Otu nwata akwụkwọ Naịjirịa gwara BBC Igbo na ha anaghị apụta ezi, ọ sị n'obodo Wuhan ha nọ dịka ebe a gbara ọsọ agha.

Njem Nleta

Ndị njem

Ebe foto si, Getty Images

E wepụ ahụike, njem bụ ihe ọzọ ọrịa coronavirus kachasị metụta na ndụ ndị mmadụ.

A machiela ndị mmadụ ịgagharị n'ọtụtụ ebe dị iche iche na Chaịna.

N'otu aka ahụ ọtụtụ mbaụwa na ụlọọrụ ụgbọelu dị iche iche amachiela ime njem gaa Chaịna akwụsịla.

Nke a metụtara ọtụtụ Naịjirịa nakwa mba ndị ọzọ na-aga Chaịna azụta ngwaaghịa maọbụ ilegharịanya.

Agụpụ ndị a dị n'akụkọ a e nwekwara ọtụtụ ụzọ ndị ọzọ coronavirus nwereike iji metụta ndụ mmadụ.

Akụkọ ga-amasị gị: