Ruth Okafor :Mmegbu kpatara m ji bido igbu pịpịrọ n'asọmpị bọọlụ
Nwaada Ruth Nwadinma Okafor na-egbu pịpịrọ n'asọmpi bọọlụ kọwara etu njem ya si malite n'igbu bọọlụ.
Ọ sị na o bu ụzọ malite ịgba bọọlụ mana mecha banye n'igbu egbu n'ihi etu otu onye ogbu bọọlụ si gbujọọ asọmpi nke mere ka e merie ha.
Okafor sị na o ji we ahụ na mwute ga mụọ etu e si egbu pịpịrọ na bọọlụ bụ 'referee' na Bekee.
Ọ kọwakwara etu o si nwete ọzụzụ ịzọ ndụ ndị ọgba bọọlụ dara n'ọgbọegwuregwu bọọlụ nakwa ụfọdụ n'ime ọ zọrọ ndụ.
Okafor nyere ndụmọdụ ka onye ọbụla gbalịa chọpụta akaraka ya ma soro ya na-eleghi anya n'azụ.
Kirie ihe o kwuru n'uju;


