Ndị ọrụ nchekwa wakporo ụlọ Joy Nunieh na Pọtakọt

Ebe foto si, Joy Yimebe Nunieh/Facebook
Ndi ọrụ nchekwa awakpoola ụlọ Joy Nunieh, onye bụbu onyeisi ụlọọrụ NDDC dị n' Owuru Creekview, dị na Pọtakọt n'ụtụtụ taa bụ Tọzde.
Nunieh na Godwill Akpabio bụ Mịnịsta na-ahụ maka Niger-Delta Ministry kwesịrị ịpụta n'ihu kọmiti Ụlọomeiwu Ukwu taa bịa zara ọnụ ya n'ebubo mmefu e mefuru ijeri naira iri anọ (N40bn) ego ndị isi chere ka abịa lekọtaraburu NDDC.
Mana ndị uweojii ụfọdụ bu ebe jiri uwe ha, ebe ndị ọzọ ji akwa nkiti wujuru n'ụlọ ya n'ụzọ ụtụtụ Tọzde.
Dịka nchọpụta BBC mere, Nunie bekuru gọvanọ Rịvas steeti bụ Nyesom Wike, onye ji ụgbọala ya bịa kwọrọ ya gaa n'obi Gọọmenti Rịvas.

Ebe foto si, Ivy Etokakpan
Cheta na abalị ole na ole gara aga, Gọvanọ Wike wepụtara akwụkwọ ozi ebe ọ nọrọ kwuo na mmiri agaghị abakwa Nunieh ntị n'ihi na ọ bụ ada Rịvas.
Nke a na-eme dịka Akpabio na Nunieh na-adọrịta ụka ihe mere ijeri naira iri anọ ego NDDC a maghị ka e si mefuo.
Akpabio na-ekwu na ya amaghị ebe mmiri si banye opi ụgbọgụrụ n'ihhi na Nunieh ekweghị na-iwetara ya ozi banyere ka o si aga, , ebe Nunieh na-ekwu na ọ bụ Akpabio kpara nkata ka a napụ ya ọrụ n'ihi na ya ekweghị ka emefuo ego na ụlọrụ ahụ.
Oge BBC Igbo kpọrọ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Omoni Nnamdi, ọ kwuru na ya amaghị maka ya.
"Aga m akpọ DPO mpaghara ahụ iji mata n'ihe ahụ emere n'ezie."
Joy Nunieh ọ kụwara akịoyibo nsugbe NDDC?

Joy Nunieh bụbu onyeisi ndị a họpụtara ka ha lekọta ngalaba na-ahụ maka ọdịmma mpaghara Naịja Delta nke Bekee kpọrọ 'Niger Delta Development Commission' (NDDC), na-ebo Minista na-ahụ maka mpaghara ahụ bụ Godswill Akpabio ebubo nrụrụka nakwa ịchọ idina ya.
Nunieh, n'okwu ọ gwara ndị ntaakụkọ, boro Akpabio ebubo na ọ nọ na-amanye ya ka ọ ṅụọ iyi ga-eme ka ọ ghara ịgba ama nrụrụaka e mere n'ime ọnwa anọ ọ rụrụ ọrụ dịka onyeisi NDDC.
Maazị Akpabio n'onwe ya gara ụlọ ntaakụkọ Arise ga kwuo na ihe Nunieh na-ekwu bụ okpotokpo asị.
O boro Nunieh ebubo na onweghi asambodo na-egosi na o fere Naịjirịa otu afọ nke a kpọrọ "National Youth Service Corps" (NYSC).
Akpabio sị na ọ bụ ihe a mere eji chụọ Nunieh n'ọrụ.
Ka a ka na-eche na okwu ajụọla oyi, Nunieh kwuru nke tọrọ ibe ya oge ọ gara Arise ga sị na iwe Akpabio bụ na ọ gbajọrọ mmekọrịta nwoke na nwannyị ọ rịọrịọ ya.
Ebubo mmadụ abụọ a na-awụsa n'isi onwe ha tụrụ ndị mmadu n'anya, nke mere ka ụfọdụ na-asi ka Minista Akpabio rituo n'ọkwa.
Kedụ ebe okwu a malitere?
Edemede a nwere ihe ndị si na Google YouTube. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Google YouTube iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of YouTube post
Dịka akụkọ siri kwụrụ, okwu dị n'etiti mmadụ abụọ a malitere oge Akpabio chụrụ Nunieh n'ọrụ n'ọnwa Febụwarị nke 2020.
Onyeisiala Muhammadụ Buhari mechara họrọ Kemebradikumo Pondei, onye ọkammụta n'ihe banyere ahụike, ka ọ nọchie anya odoziakụ Nunieh.
Akpabio sị na ọ bụ maka nnyocha ha na-eme kpatara ude NDDC ji ede ugbua.
Ọ sị na kemgbe ehibere ngalaba a, ọ bụ sọsọ mpụ na nrụrụaka na-aga n'ihu n'ime ya.
"A ma m na a ga-ebuso m agha maka mkpocha m chọrọ ime na ngalaba ahụ," Akpabio kwuru.
Joy Nunieh na onwe ya sị na nke ahụ bụ asị.
"Ihe Akpabio bịara ịgwa ndị ụwa bụ ihe banyere di ole m lụrụ. Ọ ga-abịa agwa ụwa ndi bụ di anọ m lụrụ nakwa ihe mere o ji bụrụ ụdịrị ihe a ka ọ chọrọ ikwu maka ya."
Ọ sịkwa na ọ bụ asị na ya enweghị asambodo.
"Ihe mere bụ na-enweghị m nke enyere m, makana o furu. E dere m akwụkwọ ka ma jiri nwete ọzọ."
Nunieh na-akọwa na onweghi ikpe ọbụla mara ya nke a ga-eji sị na ya metara ihe a ga-eji chụọ ya n'ọrụ.
Okwu butere okwu

Ebe foto si, Godswill Obot Akpabio
Ndị na-arụ ọrụ na ndị rụbụrụ ọrụ na NDDC na-ebo onwe ha ebubo nrụrụaka kemgbe Onyeisiala Buhari sị ka e nyochaa etu esi emefu ego na ngalaba ahụ n'afọ 2020.
N'ụbọchị ise nke ọnwa Mee, ndị omeiwu Naịjirịa hibere kọmịtii mmadụ ise ga-enyocha "mmefu ego aghara aghara" nke ndị ehibere ka ha chia NDDC a kpọrọ "Interim Management Committee" (IMC).
Ndi omeiwu na-akọwa na ngalaba NDDC emefuola ihe karịrị ijeri naịra iri anọ n'esoghi ụzọ ziri ezi.
Mana, ndị na-achị NDDC si na ọ bụ ndị achọghị ka e nyochaa NDDC kpatara atụmatụ a ndị omeiwu wepụtara.
NDDC na onwe ha na-ebo onyeisi oche Kọmitii na-ahụ maka Naịja Delta na NDDC bụ Peter Nwaoboshi ebubo na aka ya dị na nrụrụaka ijieri naịra atọ na ụma isii.
Maazị Nwaoboshi sị na aka ya adịghị ya ma kwukwaa na ha amaghị ụlọọrụ ndị a kpọrọ aha banyere nrụrụaka a.
N'otu aka ahụ Nunieh na-akọwa na Akpabio binyere aka n'ego niile ha mefuru na NDDC.
Nke bụ eziokwu bu na ahụbeghị azu okwu a.










