Akpabio: Ụmụnwaanyị, ihe a ọ bụ ụkwụ nama ji eje Aba?

Ebe foto si, Martha Udom/Facebook/GA/Twitter
Ihe mkpuchi aka n'anya mere n'ọdọụgbọelu Victor Attah dị n'Uyo ụbọchị 14 nke ọnwa Disemba 2018, ka nwunye onyeisiala, Aisha Buhari bịara Akwa Ibom maka mmepe ogige a na-azụ ụmụnwaanyị n'ọrụaka.
"Ọgụ ahụ bidororị tụpụ ụgbọelụ nwaanyị mbụ na Naịjirịa bụ Aisha Buhari eruo ala", dịka ọnye nọ ebe ihe ahụ mere, nke na-achọghị ka a kpọọ aha ya si gwa BBC.
Ndị otu APC nke Sinetọ Godswill Akpabio bụ onye ndu ha nọ ebe ahụ.
Onye na-azọro APC ọkwa gọọvanọ n'Akwa Ibom Steeti bụ Obong Nsima Ekere, nọkwa ebe ahụ ya na Sinetọ John Udoedehe.
Ndị bu ụgbọala dị ọtụtụ bịara zute nwunye onyeisiala. N'aka nke ọzọ, ndị otu PDP bukwa ọtụtụ ụgbọala nke ha ịbịa zute nwunye onyeisiala.
Otu abụọ a kpọcha obere nwa ji ọmarịcha okoko n'aka ha ga-enye Aisha.
Mgbe ụgbọelụ Aisha Buharị ruru ala, egwu dara ebe ahụ.
Ndị mmadụ amaghị ụgbọala nke ọ ga-eso eso.
Aisha Buharị bịara Akwa Ibom imeghe ogige ebe a na-azụ ụmụnwaanyị n'ọrụaka nke ha sị na ọtụtụ ụmụnwaanyị ga-erite uru na ya.
Mgbe ụzo ụgbọeleụ ya meghere ka ọ rịtuo, Aisha hụrụ ihe na-eme n'ala.
Ụlọma Akpabio gbagawara ka ọ ga-zute ya mana ndị ọrụ nchekwa ekweghị ya.
Aisha Buhari jiri nwanyọ lachie azụ, ụzọ ụgbọelụ ya mechie.
"Ndị otu abụọ a fọrọ nwantakiri ka ha lụọ ọgụ ebe ahụ"
Nwoke a hụ gbaara BBC ama sị na "ọ nọro ihe dịka nkeji iri na abụọ tupu Aisha apụta ọzọ.
Mgbe Aisha mechere pụta o biri Martha Udom ọma, soro ya banye na ụgbọala nke ya waa.
Ọ nweghị onye maara ihe gara n'azụ.











