Boko Haram ga-agwụ site n'amara Chineke - Buhari

Ndị ndu mpaghara Chad Basin

Ebe foto si, @BashirAhmaad

Nkọwa foto, Ndị bịara ọgbakọ nke taa gụnyere Onyeisiala mba Chad bụ Idris Deby Itno, Onyeisiala Nijee bụ Mahamadou Issoufuo na Praịm Minista mba Kamerun bụ Philemon Yang.

Onyeisiala Buhari akpọọla ndị ndu mpaghara Chad Basin oku ọzọ pụrụiche maka okwu nchekwa na mpaghara ahụ.

N'ime ọgbakọ nke ha nwere taa n'Abuja, Buhari kwuru na oge eruola mgbe ndị ọjọọ bụ Boko Haram ga-akwara ngwo ngwo ha pụọ.

N'okwu ya "Nke a bụ agha a ga-alụcha, anyị ga-enwe mmeri site n'amara Chineke, n'ikpochapụ ihe iyi ndụ egwu na mpaghara a.

"Ndị ndu ibe m, cheta nụ n'ọgbakọ anyị na N'Djamena, inwogharị usoro anyị ji ebu agha a bụ isiokwu anyị.

"Mkparịtaụka anyị taa bụ maka inyocha ozi ndị kọmittee anyị hiwere wepụtara na ụzọ anyị ga-eji aga n'ihu".

Ndị bịara ọgbakọ nke taa gụnyere Onyeisiala mba Chad bụ Idris Deby Itno, Onyeisiala Nijee bụ Mahamadou Issoufuo na Praịm Minista mba Kamerun bụ Philemon Yang.

Cheta na ha nwere ọgbakọ yiri nke a n'isi mba Chad bụ N'Djamena n'ọnwa Nọvemba.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị: