Ipob sị ndị otu ha nọrọ n'ụlọ ụbọchị a ga-eme ntuliaka nke 2019

Biafra na Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ode akwụkwụ mgbasa ọzị Ipob, Peace Chukwudi sịrị na Biafra ga abịa ọsịsọ ma Buhari bata ọzọ

Ndị otu Indigenous People of Biafra (Ipob) agwala ndị otu ha niile ha nọrọ n'ụlọ mgbe a ga-eme ntuliaka nke 2019.

Onye kwuru nke a bụ Ukochukwu Udochukwu Peace mgbe ya na BBC nwere mkparịta ụka ụtụtụ Satọde.

Peace sị na ọ bụ ụzọ ha ga sị mee ka onye ọbụla kpọro ọnwe ya nwa Biafra ghara iso ga ya bụ ntuliaka n'afọ ọzọ.

Ọ sị n'Ipob ekpebịelarị kemgbe na ha agaghị eso eme ntuliaka ahụ bụ nke ha sị na-onweghị isi.

Peace Udechukwu

Ebe foto si, Rev Peace

Nkọwa foto, Rev. Peace Udechukwu bụ ọnụ na-ekwuru Ipob n'Abuja

Na olụ ya, "ị na-eme ihe ị na-eme kwa afọ anọ na-atụ anya ịnwete mpụtara dị iche, onwe gị ka ị na-aghọgbụ."

Ọ sị na ihe a bụ ụzọ ndị ọbụla na-ebu agha mnwere onwe ga-eso ka ụwa mara na ha kpọrọ ya ihe.

Akụkọ ga-amasị gị