FRSC ehiwela ụlọikpe mbugharị n'okporoụzọ
Akụkọ dị mkpa
Ulọọrụ 'Road Safety' ehiwela ụlọikpe mbugharị

Ebe foto si, FRSC/Facebook
Ụlọọrụ na-ahụ maka Ejealọ njem ụgbọala bụ Road Safety ekwuola na ụlọikpe mbugharị dị narị abụọ na otu nke ha hiwere maka ndị nnupuisi n'iwu na-achị okporoụzọ ga-amalite ọrụ na Monde.
Onyeisi ha bụ Boboye Oyeyemi kwuru na onye ọbụla nupuruisi n'iwe ndị a ga-agba ekeresimesi nke ya n'ụlọ mkpọrọ.
Mkparịtaụka ndị ndu Chad Basin

Ebe foto si, @BashirAhmaad
Agha Boko Haram ga-agwụ site n'amara Chineke, Nke a bụ okwu onyeisiala Buhari gwara ndị ogbo ya si mba ndị ọzọ mejupụtara Chad Basin n'ọgbakọ ha nwere n'Abuja.
Ọgbakọ ha a bụ maka ịkpa nkata ụzọ ọhụrụ eji ebuso Boko Haram agha karịsịa n'oke ogbugbu ndị agha mba ndị a.
N'ofesi

Ebe foto si, AFP
Ndị yi uwe odo odo eme ngagharịiwe na mba Fransị e nupula isi na mmachị gọọmentị ma gaa n'ihu na ngagharịiwe nke werela izuụka ise.
Nke a malitere n'ihi ntinye ego n'ụtụisi mmanụ ụgbọala mana ọ baala n'okwu ndị ọzọ nke gụnyere inwogharị agụmaakwụkwọ.
N'egwuregwu

Ebe foto si, Google
Nkeji
Ihe nkiri
Ndị Uweojii adọọla ndị omekaome aka na ntị

Ebe foto si, NP/Twitter
Ndị ụweojii n'Anambra steeti akala ndị na anata oriri ekeresimesi obi, sị ha natawa na egwu adịghị.
Haruna Mohammed bụ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii na steeti ahụ sị na ndị otu ha na ndị ọrụ nchekwa ndị ọzọ ga-anọ ebe niile ma dọkwaa ndị na-agba egbe aṅụrị Bekee kpọrọ "Knockout" aka na ntị ha sepụ ya bụ aka enwe n'ofe n'izu a.
Ndị agha Naịjirịa eweliela mmachi UNICEF

Ebe foto si, Getty Images
Ndị agha Naịjirịa eweliela mmachị ha machiri otu UN na-ahụ maka ọdịmma ụmụaka akpọrọ Unicef.
Cheta n'ụbọchị Fraịde na ndị agha Naịjirịa boro Unicef ebubo na ha na-agbara ndị omeketereihepụụjọ Boko Haram ama.

Ebe foto si, Reuters
N'ofesi, mba Australia esorola na mba nab atara West Jerusalem dịka isiobodo mba Israel.
Praịm Minista mba Australia bụ Scott Morrison sịkwa na ha nabatakwara ndị palistain ịkwụrụ onwe ha dịka mba nke ha, ma were East Jerusalem mere isiobodo ha.
Mo Salaheturula ugo ọkaibe nke Afrika

N'egwuruegwu, Mohammed Salah nke Ejipt eturula ụgọ ọkaibe nke BBC African Footballer nke afọ 2018.
Salah dị afọ iri abụọ na isii (26) bụ onye kacha nye goolu n'asọmpi "Premier League" ma bụrụkwa onye nyere goolu niile Egypt nyere na iko mbaụwa.












