Gini mere Izrel ji kpụpụ nwunye Netanyahu ụlọikpe?

Netanyahu na nwunye ya.

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Ebubo kwuru na nwunye Netanyahu zuru nrị na esi ebe obi di ya nwere onye osi nri

Ndị uweojii n'Izrel akpụpụla nwunye onyeisiala ha bụ Sara Netanyahu ulọikpe maka ebubo mpụ na mmerụaka e boro ya.

Ebubo a na-ebo nwunye Netanyahu gbasara iji dọla narị puku jiri zuo nrị n'obi onyeisiala Izrel etu o kwesịghị.

Nsogbu a Sara Netanyahu nwere bụ otu n'ime nsogbu ezinaụlọ ha na-enwe kemgbe ndị nyocha bidoro itinye anya n'etu ha jiri mefuo ego ọha.

Ngalaba na-ahụ maka ikpe n'Izrel kwuru na ọ bụ onye na-ahu maka ikpe ọha na Jerusalem tinyere akwụkwọ gbasara Netanyahu n'ụlọikpe.

Ngalaba ahụ kwuru na Sara, dị afọ 60, tụrụ asị mgbe o kwuru na ndị na-esi nrị anọghị n'obi Netanyahu, nke mere o jiri zụọ "nrị n'akpa ọha".

Ha kwuru na site n'afọ 2010 ruo afọ 2013 Netanyahu, na ndị be ya nakwa ndi ọbịa ha, jiri "aghụghọ nata nrị narị kwa narị a na-eche ruru dọla otu puku narị."

Nwunye Netanyahu, bụ onye a ma ama dika onye na-akwado di ya kemgbe ọ nọ n'ọchịchị, kwuru na onweghi ihe ekwesighi ekwesi ya mere.

Ndị okaiwu ya, n'ime ozi ha zipuru, katọrọ ebubo a, ma kwuo na o bụghị Netanyahu zụrụ nri ndị a, nke ha sị na ụfọdụ n'ime ha bụ nke e nyere ndị ọbịa pụrụiche.

Na nkọwa akwụkwọ e ji hazie ebubo a, a zụtara nrị ndị a na-ese okwu n'ụlọnrị aha ha na ada ụda ọfụma.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ