Ụlọịkpe Israel azọọla ndị mbịambịa sị Afrika

Ebe foto si, Getty Images
Gọọmentị ala Isreal anaghị enwe ike ịchụ ndị mbịambịa sị na mpaghara Afrịka maka nkpebi ọhụrụ ụlọikpe nke Isreal mere.
Ụlọikpe a kwuru na onye ọbụla chụrụ ndị nbịabịa na Isreal na-enupu isi n'iwu.
Nkpebi a na-abia otu ụbọchị gọọmentị kwuru na ha na-enyocha ajụjụ niile so na omume nke a.
Ọ bụ ndị mbịambịa sị ala Eritrea na Sudan ru otu narị na iri abụọ binyere aka n'akwụkwọ akpọrọ petition na bekee riọ ụlọịkpe ka ha mee ha ebere.

Ebe foto si, Getty Images
Ụlọịkpe nyere ndị gọọmenti ruo ụbọchị iri abụọ na isi n'ime ọnwa nke a ka ha zaa ịkpe a mana ha kwukwara na tupu ụbọchị a ruru gọọmentị anaghị achụ onye mbịambịa ọbụla.
Ụlọikpe a kwukwara na nkpebi a anaghị emetụta ndị mbịambịa kwuru na ha chọrọ ị pụ n'ala Israel.
Mana osote onyeisiala Isreal bụ Tzipi Hotovely ekwuola na nkpebi a gosiri na ụlọikpe nke ala Isreal anaghị ahụ Isreal dịka ala were onweha.
Ndị nbịanbịa sị npaghara Eritrea na Sudan na-agba ọsọndụ makana agha na-esu na ala ha.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:










