World Cup 2018: Messi ebee ka Kroeshia gbara ha 3-0 iji gosi ha nkarị

Ndị Ajentina na-eme njikere

Ebe foto si, Getty Images

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 4

Kroeshia enwetala mmeri abụọ n'asọmpi a ka ha ji goolu atọ merie Ajentina.

N'ọgbọ egwuregwu Nizhny Novgorod, ndị n'ọchị ndị n'akwa ka ndị Kroeshịa meriri Ajentina.

Daalụ maka isonyere anyị taa. Sonyekwa anyị echi mgbe anyị ga-ewetara gị ihe ndị ọzọ na-agba.

Kroeshia ji 2-0 merie Naịjirịa, mana ha tụkwasịrị ya otu taa ka ha meriri Ajentina.

E gbuchiela bọọlụ. Ajentina achịtaghị aja ka Kroeshia gosichara ha nkarị.

Nkeji 90 na ụma: Kroeshia ewepụla Mandzukic tinye Corluka. Ogbu bọọlụ nyere Brozovic akwụkwọ edo edo.

Nkeji 90 na ụma: GOOOOOOLLLLUUUU! Rakitic agbakaala neetị ndị Ajentina.

Nkeji 90: Messi ebutela bọọlụ n'ihu poostu ndị Kroeshia, mana isi apụtaghị.

Nkeji 86: Ogbu bọolụ enyela Acuna akwụkwọ edo edo.

Nkeji 85: Ogbu bọolụ enyela Otamendi akwụkwọ edo edo.

Nkeji 84: Ọgụ achaala ka Otamendi gbaturu Rakitic ma gbakwaa ụkwụ ka o dina n'ala.

Nkeji 82: Kroeshia ewepụla Perisic tinye Kovacic.

Nkeji 80: GOOOOLUUUUU! Modric agbakaala neetị ndị Ajentina

Rakitic na-akpakwa ike n'egwuregwu a.

Nkeji 75: Rakitic adaala n'etiti ọgbọ egwuregwu. Ndị ọzọ gbarala bọọlụ na-aga, mana ogbu bọọlụ mechara gbuo bọọlụ. Ọ pụrụ ga nata nleta mana ọ batala.

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Nkeji 73: Strinic agbatuola Messi, ogbu bọọlụ enyela Ajentina 'free kick', mana efe enyeghị.

Akara ntụ-ntụ

A ka na-ekwu okwu goolu Caballero mere ka Kroeshia nye ha

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Akara ntụ-ntụ

Nkeji 68: Ajentina ewepụla Perez tinye Dybala.

Nkeji 67: Ogbu bọọlụ enyela Vrsaljko akwụkwọ edo edo.

Nkeji 65: Mandzukic enyechakwaala goolu ugbua mana bọọlụ gara n'akụkụ neetị kama ibanye ya n'ime.

Nkeji 64: Messi na Meza agbaala bọolụ gara nso neetị mana ọ banyeghị.

Nkeji 63: Ndị Kroeshia na-acha ndị Ajentina ọkụ dị egwu.

Nkeji 58: Ogbu bọọlụ enyela Mandzukic akwụkwọ edo edo.

Nkeji 57: Kroeshia ewepụla Rebic nyere goolu, tinye Kramaric.

Nkeji 56: Ajentina ewepụla Salvio tinye Pavon.

Nkeji 54: Ajentina ewepụla Aguero tinye Higuain.

Nkeji 53: GOOOOOLLLUUUU!!! Rebic agbakpuola goolu na neetị ka Caballero bunyere ya bọọlụ n'ihu neetị ya.

Nkeji 51: Enyela Mercado akwụkwọ edo edo.

Nkeji 49: Bọọlụ kụrụ Modric n'aka na-amaghị ama, mere ka ogbu bọọlụ nye ndị Ajentina 'free kick'.

Nkeji 48: Salvio ebutela bọọlụ na-achọ Messi maọbụ Aguero, mana Vida bu ụzọ bute ya ma bughachịrị ya Subasic.

Skip X post, 3
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 3

Nkeji 46: Ọkara nke abụọ ebidola.

Enyebeghị goolu ọbụla n'egwuregwu a. Ogbu bọọlụ egbuchiela ọkara a ka ndị mmadụ gaa ezumike nkeji 15.

Nkeji 45: Rebic ebutela nri chinyere, mana ọ gbafuru ya n'elu neetị Caballero.

Nkeji 45: Ogbu bọọlụ etinyela nkeji abụọ.

Nkeji 44: Agbatuola Vrsaljko mana ogbu bọọlụ enyeghị onye ọbụla akwụkwọ edo edo.

Nkeji 43: Onye ga-ebu ụzọ enye goolu n'guwregwu a? Otu abụọ a erichaala ohere ọma gaara abụ ezigbo goolu.

Nkeji 39: Rebic enwetala akwụkwọ edo edo.

Nkeji 38: Mascherano agbaala 'free kick' ha nwetara, mana Subasic ghọrọla bọọlụ ahụ n'ihu poostu ya.

Nkeji 36: Mercado na-enweta nleta ka ya na Rebic sukọtara onwe ha n'ihu poostu ndị Kroeshia.

Nkeji 32: Mandzukic atafuola bọọlụ ezi n'ihu poostu ndị Ajentina.

Nkeji 29: Perez agbafuola bọọlụ n'agbanyeghị na ọ bụ naanị ya na poostu nọ maka na Subasic anọghị n'ihu poostu ya.

Nkeji 27: Meza agbafuola bọọlụ n'kụkụ neetị ndị Kroeshia.

Nkeji 26: Aguero ebubala bọọlụ n'ihu poostu Kroeshia, mama ọ pụrụ 'corner'. Ha gbara ya bụ 'corner' mana isi apụtaghị.

Nkeji 21: Acuna gbara bọọlụ kụrụ Vida ma gafere ihu neetị ma bie n'igwe poostu.

Nkeji 20: Mandzukic ebutela bọọlụ Caballero chọrọ inye Tagliafico n'ihu poostu ndị Ajentina!!!. Mana naanị 'free kick' ka ọ pụtara.

Nkeji 18: Tagliafico na Otamendi na-anwa ike ha, mana bọọlụ adapụla ezi. Ka a tụbatara ya, Messi butere ya ma buru ya gaa n'ọkara ndị Kroeshia, mana Mascherano gbaturu Modricc mere ka Kroeshia nweta 'free kick'.

Nkeji 12: Messi ebutela bọọlụ gbaa shọọtụ mana ọ gbara ya n'aka Subasic.

Nkeji asaa: Mandzukic na Otamendi akụkọtala onwe ha ka ha abụọ chụrụ bọọlụ na-aga, mere ka Otamendi nweta 'free-kick'. Isi apụtaghị ka ha gbara ya.

Nkeji anọ: Perisic agbaala shọọtụ na neetị, mana Caballero kụpụrụ ya 'corner'.

Otu nkeji: Egwu ebidola n'ọgbọ egwuregwu Nizhny Novgorod.

Ndị Kroeshia

Ebe foto si, Getty Images

Onye egwu ndị Ajentina bụ Di Maria ebidoghị bọọlụ, ọ nọ n'oche ndị enwere ike iwebata ewebata.

Ndị nọ n'ocheKroeshia: Josip Pivaric, Vedran Corluka, Dominik Livakovic, Marko Pjaca, Lovre Kalinic, Tin Jedvaj, Mateo Kovacic, Andrej Kramaric, Duje Caleta-Car, Filip Bradaric, Milan Badelj

Ndị nọ n'oche Ajentina: Franco Armani, Paulo Dybala, Ever Banega, Cristian Ansaldi, Marcos Rojo, Lucas Biglia, Gonzalo Higuain, Ángel Di Maria, Federico Fazio, Nahuel Guzman, Giovani Lo Celso, Cristian Pavon

Ndị Kroeshia bidoro bọọlụ: Danijel Subasic; Domagoj Vida, Ivan Strinic, Sime Vrsaljko, Dejan Lovren; Marcelo Brozovic, Ivan Perisic, Ivan Rakitic, Luka Modric, Ante Rebic; Mario Mandzukic

Ndị Ajentina bidoro bọọlụ: Willy Caballero; Nicolas Tagliafico, Nicolas Otamendi, Gabriel Mercado, Eduardo Salvio; Javier Mascherano, Enzo Perez; Maximiliano Meza, Lionel Messi , Marcos Acuna; Sergio Aguero