World Cup 2018: Rọshịa emeriela Ijipt 3-1

Ebe foto si, Getty Images
N'ọgbọ egwuregwu St. Petersburg, ndị n'ọchị ndị n'akwa ka ndị Rọshịa meriri Ijipt.
Daalụ maka isonyere anyị taa. Sonyekwa anyị echi mgbe anyị ga-ewetara gị ihe ndị ọzọ na-agba.
E gbuchiela bọọlụ. Ndị Ijipt nwara ike ha, gbaa ezigbo bọọlụ mana ndị Rọshịa eburula ebube site na goolu atọ ha nyere.
Nkeji 90 na ụma: Ijipt ka na-anwa ike ha ịma ma ha a ga-enyenwu goolu ọzọ, mana isi apụtaghị. Rọshịa emeriela ma gafee agba mgbapụ (knockout stages)
Nkeji 90: Ogbu bọọlụ etinyekwuola nkeji anọ. Isi Ijipt a ga-apụtakwa?
Nkeji 87: Salah enwetala ohere inye goolu, gbaa shọọtụ mana o kweghị aba na neetị.
Nkeji 85: Rọshịa ewepụla Yuri Zhirkov tinye Fedor Kudryashov.
Nkeji 84: Enyela Smolov akwụkwọ edo edo.
Nkeji 82: Ijipt ewepụla Marwan Mohsen tinye Kahraba.
Nkeji 78: Rọshịa ewepụla Dzyuba tinye Fyodor Smolov.
Nkeji 73: GOOOOLLUUUU! Salah agbanyela bọọlụ na neetị. Oge ka fọrọ nkeji 17.
Nkeji 72: Salah enwetala Penariti. Ọ ga-agbanyenwu ya na neetị?
Nkeji 71: Salah adaala n'ihu poostu ndị Rọshịa. A ga-enyocha ihe nkiri VAR ịma ma a ga-enye ya penariti.
Nkeji 67: Ijipt ewepụla Trezeguet tinye Ramadan Sobhy.
Nkeji 66: Trezeguet enwetala ohere inye goolu, mana ọ gbafuru bọọlụ.
Nkeji 64: Ijipt ewepụla Mohamed Elneny tinye Amr Warda.

Ebe foto si, Getty Images
Nkeji 61: GOOOLUUU! Artem Dzyuba agbakaala neetị ndị Ijipt. Nke a ga-eme ya goolu abụọ ọ na-enya kemgbe asọmpi a bidoro.
Nkeji 59: GOOOLUUU! Denis Cheryshev agbakaala neetị ndị Ijipt.
Nkeji 57: Trezeguet enwetala akwụkwọ edo edo maka ịgbatu onye Rọshịa.
Nkeji 55: Salah ebutela bọọlụ gbaa shọotụ, mana ọ pụrụ 'corner'. Ha agbaala 'corner' a mana isi apụtaghịkwa maka na bọọlụ gaferela onwe ya n'ihu neetị.
Nkeji 51: Enyela 'own goal' ise kemgbe asọmpi a bidoro, ndị si Afrịka (Moroko, Naịjirịa na Ijipt) nyere atọ n'ime ya.
Nkeji 46: GOOOOLLLLUUU!!!! Ahmed Fathy nke Ijipt ejirila aka ya gbakaa neetị ha. Nke mere ka ndị Rọshịa jiri otu ọkpụ goolu na-emeri Ijipt.
Nkeji 45: Amalitela ọkara nke abụọ, ma gbatuo Trezeguet.
Nkeji 45: Egbuchiela ọkara nke mbụ ka ndị mmadụ nwee ezumike nkeji 15.
Nkeji 41: Salah anwaala inye goolu ka ọ kpachara Zhirkov, mana bọolụ abanyeghị na neetị.
Nkeji 34: Mohsen ejirila isi ya na-enye nsogbu, mana o nyenwughị goolu.
Nkeji 23: Gazinski ebutela bọọlụ mana o ji shọotụ gbafuo ya.
Nkeji 21: Ndị Rọshia enyebeghị Salah ohere imegharị ahụ.
Nkeji 18: Cheryshev agbaala shọọtụ, mana ọ banyeghị etu o siri chọọ. Ndị Rọshịa na-acha ndị Ijipt ọkụ dị egwu.
Nkeji 15: Trezeguet agbaala shọọtụ n'ihu poostu Rọshịa, mana ọ banyeghị.
Nkeji 15: Ijipt enwetala 'corner' mana isi apụtaghị.
Nkeji 13: Ụkwụ Salah emetụla bọọlụ, mana ndị Rọshịa enyebeghị ya ohere megharịa ahụ.
Salah na-agba taa, nke nwere ike ime ka egweu dagharịala ndị Ijipt.
Nkeji anọ: Ijipt anwaala ihu poostu ndị Rọshịa, mana bọọlụ gbafere akụkụ neetị.
Otu nkeji: Egwu ebidola n'ọdọ egwuregwu St. Petersburg.
Ọ bụrụ na-emerie Ijipt taa, nsogbu adịla maka na ọ ga-arịa ha ahụ ịgafe n'agba nke 16.

Ebe foto si, Getty Images
Ndị nọ n'oche Rọshịa: Andrey Lunev, Vladimir Gabulov, Fedor Smolov, Aleksey Miranchuk, Igor Smolnikov, Aleksandr Erokhin, Fedor Kudryashov, Daler Kuzyaev, Andrey Semenov, Vladimir Granat, Anton Miranchuk.
Ndị nọ n'oche Ijipti: Essam El Hadary, Sherif Ekramy, Ramadan Sobhi, Kahraba, Shikabala, Ahmed El Mohamady, Omar Gaber, Ayman Ashraf, Amr Warda, Mahmoud Hamdi, Sam Morsy, Saad Samir.
Ndị Rọshịa bidoro bọọlụ: Igor Akinfeev; Mario Fernandes, Ilya Kutepov, Sergei Ignashevich, Yuri Zhirkov; Yuri Gazinskiy, Roman Zobnin; Aleksandr Samedov, Aleksandr Golovin, Denis Cheryshev; Artem Dzyuba.
Ndị Ijipti bidoro bọọlụ: Mohamed El-Shenawy; Ahmed Fathy, Ali Gabr, Ahmed Hegazi, Mohamed Shafy; Mohamed Elneny, Tarek Hamed; Mohamed Salah, Abdallah El Said, Trezeguet; Marwan Mohsen.
Salah na-esoghị gbaa bọọlụ mbụ ndị Ijipt ga-eso agba nke taa.









