World Cup 2018: Lee mmadụ ise riterela 'Golden Boot' n' Iko Mbaụwa ise

Buut ọlaedo

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, bụ nke a na-enye ndị kachasị nyeta goolu n'asọmpi Iko Mbaụwa nke ndị FIFA na aghazi.

Nturuugo 'Golden Boot' bụ nke a na-enye ndị kachasị nyeta goolu n'asọmpi Iko Mbaụwa nke ndị FIFA na- ahazi.

A na-ahazi ndị kachasị nye goolu n'ogogo n'asọmpi Iko Mbaụwa ọbụla a na-agba.

A malitere na-enye nturuugo a n'afọ 1982 n'aha akpụkpọ ụkwụ ọlaedo(Golden Shoe) mana agbanwere aha ya kpọọ ya, 'Golden Boot' n'afọ 2010.

Ọ bụrụ na-enwe ihe ruru mmadụ abụọ nwere otu ọnụ ọgụgụ goolu, a ga-enyocha enyemaka ha nyere na goolu ndị ọzọ ma họrọ onye kachasị nye aka.

Mana kemgbe afọ 2006 a na-enye ya onye nke kachasị nwee ohere nta n'ịgba asọmpi n'afọ ahụ.

Ndị riterela 'Golden Boot' n'oge ise nke asọmpi Iko Mbaụwa gụnyere ndị a;

Davor Suker:

Davor Suker

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, O ritere nturuugo buut ọlaedo n'asọmpi Iko Mbaụwa nke afọ 1998 nke a gbara na mba Fransị.

Davor Suker bụ nwafọ mba Kroeshịa.

O ritere nturuugo buut ọlaedo n'asọmpi Iko Mbaụwa nke afọ 1998 nke a gbara na mba Fransị.

Davor Suker na Buut ọlaedo

Ebe foto si, Mark Thompson

Suker nyere goolu isii iji nwete ihe nturuugo buut ọlaedo.

Kroeshịa gbara ndị atọ ebe Fransị gara n'ihu maburu Iko Mbaụwa ahụ.

Ronaldo Luis Nazario de Lima:

Ronaldo De Lima

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ronaldo bụ nwafọ Brazil, ọ ritere buut ọlaedo ya n'Iko Mbaụwa Saụt Korịa/Japan afọ 2002.

Ronaldo bụ nwafọ Brazil, ọ ritere buut ọlaedo ya n'Iko Mbaụwa Saụt Korịa/Japan afọ 2002.

O nyere ọkpụ goolu asatọ n'oge asọmpi ahụ niile dịka o nyere goolu n'agba ikpeazụ.

Ronaldo na Buut ọlaedo

Ebe foto si, Getty Images

Brazil meriri Jamịnị iji mabute Iko Mbaụwa nke afọ 2002.

Miroslav Klose:

Miroslav Klose

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Nwafọ mba Jamịnị bụ Miroslav Klose ritere nke ya na mba ha bụ Jamịnị n'Iko Mbaụwa 2006.

Nwafọ mba Jamịnị bụ Miroslav Klose ritere nke ya na mba ha bụ Jamịnị n'Iko Mbaụwa 2006.

Klose nyetere ọkpụ goolu ise n'agbanye ha gbara ndị nke atọ.

Miroslave Klose na-egosi Buut ọlaedo

Ebe foto si, Getty Images

Mba Itili gara n'ihu mabute Iko Mbaụwa nke afọ ahụ.

Thomas Muller:

Thomas Muller

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Thomas Muller bụ nwafọ mba Jamịnị nyere goolu ise iji rite buut ọlaedo ebe Jamịnị gbara ndị atọ.

N'asọmpi Iko Mbaụwa afọ 2010 na Saụt Afrịka ka a gụrụ ya aha 'Buut Ọlaedo' ebe.

Thomas Muller bụ nwafọ mba Jamịnị nyere goolu ise iji rite buut ọlaedo ebe Jamịnị gbara ndị atọ.

Thomas Muller na Buut ọlaedo

Ebe foto si, Getty Images

Mba Spen maburu Iko Mbaụwa ahụ nke afọ a bụ ha mbụ ịmabute ya.

James Rodriguez:

James Rodriguez

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, James Rodriguez bụ nwafọ mba Kolombia ritere buut ọlaedo nke ya n'afọ 2014 n'Iko Mbaụwa a gbara na Brazil.

James Rodriguez bụ nwafọ mba Kolombia ritere buut ọlaedo nke ya n'afọ 2014 n'Iko Mbaụwa a gbara na Brazil.

Rodriguez nyere ọkpụ goolu isii n'Iko Mbaụwa ahụ na Brazil ebe Brazil gbapụrụ ha n'agba anọ ikpeazụ.

Rodriguez na Buut ọlaedo

Ebe foto si, Getty Images

Mba Jamịnị mechara buru Iko Mbaụwa ahụ mgbe ha meriri Ajentina n'ikpeazụ.

Aha onyonyo, Rọshịa 2018: Super Eagles nọ n'otu kachasi ike