Boko Haram: Anyị ga-akpata nkata ọhụrụ - Ndị ndu Chad Basin
Akụkọ dị mkpa
Mkpatịta ụka ndu Chad Basin

Ebe foto si, Femi Adesina
Ndị isiala mba Naịjirịa, Chad, Niger na Central Afrịcan nọ n'ọgbakọ n'isi obodo Chad bụ N'Djamena n'ilebanye n'okwu gbasara nchekwa na mba ndị ahụ.
Ọgbakọ a nke ga-ewe otu ụbọchị ga-enyere ha aka ihiwe ọrụ ọtawaike n'ibuso Boko Haram agha.
Ndi oji ego achụ ego n'ahịa Nkwo Nnewi ekwuola na ha ga-agbape ahịa ha dịka ha na-eche ịnụ ihe ndi uweojii na gọọmentị na-ekwu maka ndị otu ha eji eji.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ha kwukwara na ọ bụrụ na a tụhapụghị ha, na aga agbachikwa ahịa ahụ, tinyekwara ahịa niile dị n'Anambra rue mgbe atọhapụrụ ndị a.
EFCC ga-enyo ndị ego ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị

Ebe foto si, EFCC FACEBOOK PAGE
Ụlọọrụ EFCC ekwuola na ha ga-enyoba anya n'ego niile otu ndọrọ ọchịchị na-enwete maka ntuliaka 2019.
Onyeisi ụlọọrụ ahụ bụ Ibrahim Magu kwupụtara nke n'ọgbakọ ndị gọvanọ mere n'Abuja.
N'ofesi

Ebe foto si, Getty Images
Michael Cohen onye bụbu ọkaiwu Onyeisiala mba Amerịka bụ Donald Trump ekwuola na ọ tụrụ asị nye ndị omeiwu gbasara ụlọukwu Trump na-arụ na Rọshịa.
Cohen pụtara n'ụlọikpe na-atụghị ma kwupụta nke a n'ihu ọkaikpe n'obodo New York
Nkeji
Ihe nkiri

Ebe foto si, Getty Images
N'akụkọ yiri ibe ya otu websait ọhụrụ akpọrọ "CrossCheck Nigeria" apụtala ebe a na enyocha ma akụkọ ọbụla pụtara ma ọbụ akụko ụgha.
Ọtụtụ ndị nta akụkọ sị mba ofesi tinyere aka n'ịmụpụta websait a makana a chọpụtara na ọtụtụ akụkọ ụgha na-efegharị na Naịjirịa ugbua.
Agbagheela ụlọomeiwu Anambra steeti

Ebe foto si, TWITTER/NASS
Ndị uweojii ekwuola na ha mehela ụlọomeiwu Anambra steeti.
Cheta na ndị uweojii mechiri ya bụ ụlọomeiwu maka ọgbaghara bidoro maka nchụda a chụdara Rita Maduagwu bụbụ onyeisiụlọomeiwu ahụ.
Ha na-ekwukwa na ha ga-agba mbọ hụ na nwuchiri onyeọbụla chọrọ ịkpalite nsogbu n'ụlọomeiwu ahụ ọzọ.
N'ofesi

Ebe foto si, Getty Images
N'ofesi, onyeisi mba Ukrain na-arịọ obodo dị iche cihe n'okpuru NATO ka ha zite ndị agha enyemaka ngwa ngwa maka ebubo ha na-ebo na Rọshịa chọrọ ka Ukrain laghachị azụ dịka obodo nọrọ n'okpuru ala
Rọshịa.
N'egwuregwu

Ebe foto si, Getty Images
N'egwuregwu, onyeisi "Nigeria Football Federation" bụ Amaju Pinnick ekwuola na ọ mara otu Falcons ga-enwe mmeri na asọmpị ikpeazu nke iko mba ụwa nke ụmụnwaanyị.
Falcons na Bayana Bayana sị mba Saut Afịrịka ga-ezute n'ụbọchị mbụ nke ọnwa Dizemba nke afọ a.
Gee nkeji BBC
Lee ihe nkiri











