Air Peace: Ọ fọrọ nwa ntịị ka ọdachi mee n'ụgbọelu Air Peace?

Oge e ji agụ akụkọ nkeji 1
Skip Instagram post, 1
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of Instagram post, 1

Otu nwaada akpọrọ Chinyere Anigbo agaala na soshal midia kọwa ahụmihe ya n'ụgbọelu 'Air Peace' nke si Legọs aga Enugwu n'ụbọchị nke iri na anọ n'ọnwa Dizemba 2018.

O kwuru na nsogbu dị n'ụgbọelu bidoro tupu ha efelie elu ndịọrụ Air Peace siri ha ritue dịka e bidoro ọrụ na injin ụgbọelu ahụ.

Ọ kọwara etu ụfọdụ mmadụ anwụrụ ume nke bụ Oxygen na Bekee siri datuo nke butere na ụfọdụ mmadụ kuburu nakwa na ndị nọ nso bidoro inyere ha aka.

Ihe akpọrọ 'Oxygen mask' daturu mana anwụrụ oxygen apụtaghị n'ụfọdụ ndị njem dịka o siri kọwa.

Skip Instagram post, 2
Hapụ Instagram ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of Instagram post, 2

Anigbo na mkparịta ụka ya na BBC Igbo nwere sị na onye ọbụla nwe ngalaba ụgbọelu gba mbọ tinye anya n'ịhụ na eletakwara ya, ma haziekwa ya ọfụma.

O kwuru na ahụmihe a emeela na ọ bụzị sọsọ njem ụgbọala ka ọ ga-na eji eme njem dịka ọ na-ekele chukwu na ha daturu n'udo n'agbanyeghi ihe mberede kwadoro ime.

Aha onyonyo, Air Peace: Onye njem agbaala ama maka ihe ụgbọelu ahụ mere akpa ya

Mgbe BBC Igbo kpọrọ Air Peace ịnụ olu ha, ọnụ na-ekwchitere ha bụ Maazị Chris Iwarah kwuru na ha ma na ihe dị etu ahụ mere n'ezie.

Mana ọ gọrọ na ụfọdụ ihe Chinyere Anigbo kwuru mere dịka na usoro anwụrụ oxygen anaghị arụ ọrụ ọfụma nakwa na ụfọdụ ndị mmadụ kuburu na njem ụgbọelu ahụ.

O jikwa ohere ahụ rịọ mgbaghara maka ndị niile nọ na njem ahụ, okwu a metụtara.

Akuko ndị ọzọ ga-amasị gị: