Parliamentary system of Government: Ihe dị iche n'etiti ya na nke Presidential

Ụlọomeiwu Parlaiment nke Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images

Ihe ruru ndị omeiwu iri abụọ na abuọ akpọọla oku ga-agbanwe usoro ọchịchị ala Naịjirịa ka ọ bụrụ 'Parliamentary system'.

Iwe ha bụ na ụsoro ịnwe onyeisiala na-erị oke ego nakwa na ọ naghị enye ụmụ Naịjirịa ụdịrị ọchịchị ziri ezi.

Otu onye ọkachamara bụ Ugochukwu Egbujo tinyere ọnụ n'okwu na-akọwa na ego a na-emefu n'ọchịchị ga-ebelata.

Ihe dị ịche n'etiti ụsoro ọchịchị Presidential na nke Parliamentary.

1. Ọchịchị ga-adịzị n'aka ndị 'Constituents'

Ndị na-akwado ndọrọndọrọ ọchichị

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ọ bụzị ndị mmadụ ka ọ ga-adị n'aka ịhopụta onye ga-anọchị anya ha

Otu onye ọnụ na-eru n'okwu bụkwa onye ọkaiwu a kpọrọ Ugochukwu Egbujo kọwara BBC Igbo n'ekwentị na mgbanwe a ga-eme ka ike si na gọọmenti etiti banye n'aka mpaghara nke a kpọọ 'constituents.'

Ọ bụkwa ha ga-anọchịte anya ndị mmadụ n'ụlọomeiwu.

2. A ga-enwe agbanwe aha ụlọ abụọ e nwere na gọọmenti

House of Representatives

Ebe foto si, House of Representatives

Ugbua a nwere ụlọomeiwu ukwu bụ Sinetị nakwa ụlọomeiwu nta bụ House of Representatives.

N'okpuru ọchịchị 'Parliamentary', a ga-enwe ndị a na-akpọ House of Commons bụ ndị meriri ntụliaka nakwa House of Lords bụ ndị ahọpụtara iche abụghị ndị ndọrọndọrọ ọchịchị.

3. A ga-akwụsị ntụliaka maka ọkwa 'onyeisiala' kpam kpam

Buhari, Atiku

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Onyeisiala Buhari na Atiku Abubakar ga-akwata na ntuliaka onyeisiala na 2019

Ọ bụrụ na a nabata usoro Parliamentary, ọ ga bụzi otu jiri ọkara maọbụ ihe karịrị ya merie ntụliaka ga-ahọpụta onye ga-abụ 'Praim Minista' nakwa Onyeisiala.

Nke a pụtara na ọ bụghịzị ndị mmadụ n'onwe ha ga-ahọpụta onye ga-abụ onyeisiala.

4. Ego a na-emefu na ọchịchị ga-ebelata ọfụma

Ọgbakọ ndị ụlọomeiwu

Ebe foto si, @NGRSenate

Dịka e si eme na mba Briten nakwa ala ndị ọzọ hibere usoro Parliament, ọ ga-abụ n'etiti ndị nọ n'ụlọomeiwu ka a ga-esi họpụta ndị ga-ano n'ọkwa minista na ọkwa ndị ọzọ.

Ihe nke a ga-eme bụ na ọ ga-ebelata ụgwọ a na-akwụ ndị a ga-ahọpụta maka ọkwa minista na ndị otu ya.

Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị