South East Development Commission Bill: Kedụ uru ọ ga-abara Igbo?

Ebe foto si, Stella Oduah on Facebook
Ụlọomeiwu ukwu etinyele aka nkwado n'akwụkwọ iwu maka imepe South East Development Commission bụ kọmishọn nke ga-ahụ maka mmepe na steeti ise dị n'Alaigbo.
Dịka Sinetọ Stella Oduah na Samuel Anyanwu , bụ ndị tọrọ ntọala akwụkwọ iwu kọmishọn ahụ siri kwuo. ọ ga-enye "Ndigbo oke ruru ha".
N'ichafụ, Oduah kwuru an akwụkwọ iwu a ga-anọ ruo afọ iri bụ mgbe atụru anya gọọmenti ga-eji rụpụta arụ niile okwesiri ịrụ.
Ya bụ kọmishon nwere ike imechi ma ọbụrụ na ndị ụlọọmeiwu nabata atụmatụ onyeisiala ime otu ahụ.
N'otu aka ahụ, Sinetọ Enyinnaya Abaribe bụ onye nnọchite anya Abia-South n'ụlọomeiwu ukwu sị na ya bụ akwụkwọ iwu ga-ehicha Ndigbo anyammiri maka mmebi na mkpochapu mere Igbo oge Agha Biafra.

Ebe foto si, NASS
Ọ sịkwa n'udo na mgbaghara e kwere Igbo na nkwa kemgbe a lụchara agha Biafra apụtabeghị ihe.
N'olu ya, "ọ bụ ya ji anyị n'ala ruo ugbua".
Abaribe sị na gọọmenti kwesiri iji ọsọ ha ji mezie Ugwu Awusa kemgbe ọgụ Boko Haram were mezie Igbo bụ nke a hapụrụ kemgbe ihe karịrị afọ iri anọ.
Ọ sị na akwụkwọ iwu ahụ ga-ebute ezigbo nnabata na mmekọrịta kemgbe a lụchara Agha.
"O nweghị onye Igbo ga-ahụ ka ọnọdụ Alaigbo dị sị na ọ dịrị anyị mma".
"Bil a ga-enye ohere ka anyị bụ Ndigbo jiri aka anyị na-ekwu ihe anyị chọrọ ịrụ na be anyị."
Mgbe BBC jụrụ Abaribe ebe ego a ga-eji rụọ ọrụ na kọmishọn a ga-esi pụta, Abaribe sị na " gọọmenti steeti ga-enwepụta pasenti iri n' ego gọọmentị etiti na-enye ha n'ọnwa were tinye pasenti iri na ụmụ bụ nke gọọmenti etiti n'onwe ha ga-etinye na ọbaego kọmishọn a".
Ebe ahụ ka gọọmentị ga na esi eweta ego ha ji arụ ọrụ.
Akụkọ ga-amasị gi:











