Dozie Ikedife: Ụfọdụ ihe anyị amaghị maka Ikenga Nnewi

Dozie Ikedie
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Dozie Ikedife bụbụ onyeisi ndị Ohaneze Ndigbo n'okwa 'President General' ama ama dịka ọnụ na-ekwuru Ndigbo.

A ma ya dịka nnukwu nna na-ejikọ Ndigbo nke mere e ji etu ya, 'Ikenga.'

Lekwaihe ndị ọzọ ihe e jina-echeta Ikenga Nnewi.

  • Na afo 1970, Dike Ikedife bụ onye hibere ụlọọgwụ bụ Ikedife Specialist Hospital. Ụlọogwụ so n'otu n'ime ụlọọgwu kachasị na Nnewi. Ọ bụkwa onyeisi na ya bụ ụlọọgwụ na ndụ ya.
  • Dozie Ikedife bụbu kọmishọna na-ahụ maka nwulite akụnụba na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa ya ma bụrụkwa kọmishona na-ahụ maka okwu ego na Anambara steeti ochie.
  • Dozie Ikedife bụ dokịnta bekee ọkachamara ahụike ụmụnwaanyị.
  • Dozie Ikedife hibere nturuugo a na-akpo 'Doctor Ikedife Annual Prize' na 'Doctor Ikedife Annual Medal' maka onye kachasị n'ụmụakwụkwọ na-amụ ọrụ ahụike obodo na Mahadum Naịjirịa nke dị na Nsụka na n'ụmụakwukwọ na-amụ ọrụ dọkịnta na mahadum Nnamdi Azikiwe.
  • Na afọ 1980, e chiri ya echichi 'Ikuku Ebu Nkpu' n'obodo iri na anọ dị n'ime steeti Anambara.
  • Na afọ 1981, Igwe Nnewi, ndi obi ya nakwazi ndi Nnewi jikọlụ aka were chie Ikedife echichi ukwu bụ 'Ikenga Nnewi', ma chikwazia ya 'Odezuluigbo' n'afo 1997.
  • Dozie Ikedife kwenyesiri ike na nnwereonwe Biafra ma kwenyekwa na iji udo were nweta ya.

Dozie Ikedife nwụrụ na ụbochị Dizemba 11 n'afọ 2018. Ọ dị afọ iri asatọ na asatọ were laa mmụọ.

Ndi n'eri uju ọnwu ya bụ nwunye ya, Ejeagha Ikedife ya na ụmụ asatọ ha mụtara.

Ndi amama n'ala Naịjirịa eziela ozi ekele ha:

Atiku Abubakar bụ onye na-azọ okwa onyeisi ala ejirila igwe okwu Twitter were zigaa ozi ekele nye mkpụrụ obi Ikenga.

Skip X post
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post

Nnia Nwodo bụ onyeisi Ohaneze Ndigbo kwuputere na Ikedife bụ onye na-"ekwupụta ihe na-ewute Ndigbo na atụghị egwu ihe ndị mmadụ ga-ekwu."

Ọ gara n'ihu kwuo na Ikedife bụ nwoke nwere obi inyere mmadụ aka nke o hibere ụlọọgwu ebe ana-agwọ ma ụmụaka ma ndị ogbenye enweghi ike inyere onwe ha aka.

Gọvanọ Imo steeti bụ Rochas Okorocha tinyekwara ọnụ n'ịtụ arịrị ọnwụ Dozie Ikedife. O kwuru na Dozie Ikedife bụ onye ndu jiri ihe niile chụọ aja maka ọdịmma Ndigbo ya na obodo Naịjirịa.

Akụkọ ga-amasị gị: