Unicef: Ndị agha Naijiria eweliela mmachị ha machiri ha

Ebe foto si, SOPA Images
Ndị agha Naịjirịa eweliela mmachị ha machiri otu UN na ahụ maka ọdịmma ụmụaka akpọrọ Unicef n'ugwu Awụsa.
Ndị agha Naịjịrịa sị na ọ bụ ihe ha kpara na nzụkọ mberede ha na ndị isi Unicef mere.
Ha gwakwara ndị Unicef ha gbaa mbọ hụ na ha gwara ndị ọrụ nchekwa dị iche iche mgbe ha na-enwe ọzụzọ ndị ọhụrụ ha nabatara.
Ndị agha Naijiria chụpụrụ otu mbaụwa na-enyere ụmụaka aka a kpọrọ Unicef n'aha ịchafụ n'Ugwu Awụsa.
Ha boro ha ebubo ịbụ ndị mgbaama ndị otu Boko Haram.
Col Onyema Nwachukwu, bụ ọnụ na-ekwuru ndị agha nọ n'ọgbọ ọgụ a kpọrọ "Theatre Command, Operation Lafiya Dole," bụ onye kwuru nke a n'akwụkwọ ozi ewepụtara.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Ọ sị na Unicef "ewepụla anya ya n'inyere ụmụaka na ndị na-ata ahụhụ aka, na-azụzị ndị mmadụ na-enyopu ala."
BBC gbara mbọ inweta ọsịsa Unicef n'ihe mere, mana ha kwuru na ha na-akwado ọsịsa ha ga-enye ọha maka ya.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị









