Climate Change: Mbaụwa etinyele aka n'akwụkwọ maka ịzọpụta ụwa

Ebe foto si, AFP/Getty Images
Ọṅụ juputara ndị mbaụwa obi ụbọchị Satọde ka emechara tinyezuo aka n'akwụkwọ maka nkwekọrịta ịbenata anwụrụ kabọn nke sọ eme na okpomọkụ na-egbu mmadụ n'ụwa ugbua.
Akwụkwọ a gosiri na a ga-amalite ya bụ atụmatụ n'afọ 2020.
Nkwekọrịta mba niile n'okwu a adịghị nfe nke mere na o eji otu ụbọchị gafee ụbọchị ekwesiri ịweta ya bụ nzụkọ na njedebe.
Ndị bịara ya bụ ọgbakọ kwenyere na ihe dị na ya bụ akwụkwọ ga-eme ka onye ọbụna so na otu mbaụwa a mezuo ihe ha kwere na nkwa.
Nkwekọrịta Katowice ga-enyeaka imezu ebumnobi nke e mere na Paris bụ nke ga-eme ka okpomọkụ belata n'ụwa gbadaruo 2'C.
Michal Kurtyka bụ onyeisi COP24, dịka akpọrọ ya bụ nzukọ n'aha ịchafụ sị na "ịhazigharị ya bụ nkwekọrịta Parịs abụghị asụ anwụru".
"Ya bụ ọrụ adịghị nfe, mana anyị nwara ike anyị ịhụ na onye ọbụla tinyere ọnụ na ya bụ okwu".
Ndị mba na-emepe emepe chọrọ ka ụwa nụ olu ha ma ka a kwụọ ha ụgwọ ahụhụ ha na-ata maka okpomọkụ ụwa.
N'agbanyeghị, ndị mba mepere emepe ekweteghị na ọ bụ ha mere ụwa ji ekpo ọkụ maka oke ụgwọ ha nwere ike ịkwụ ndị na-emepe emepe.
Akwụkwọ nchọpụta kwuru na-aghọtaghịzị ebe ụwa chere ihu ebe okpomọkụ na-achọzị ịgafe 3'C.
Iwedata ya bụ ọnụọgụgụ ga-agbanwe ka anyị si ebi ndụ n'ụwa.










