Akpabio na ndị omeiwu: 'Iwu Naịjirịa enyeghị ndị omeiwu ikike ịnara ọrụngo'

Ndị ụlọomeiwu nta

Ebe foto si, @HouseNGR/ Twitter

Ndị ọnụ na-eru na-okwu ekwuola na ọ jọgburu udela ma sigbuo nkakwụ ndị ụlọomeiwu ịnara ọrụ na NDDC.

Obinna Ede na Malachy Ugwummadu bụ ndị okaiwu sị na ha dara iwu maka na ha agaghị na-akụ nkwa ma na-etekwa ete otu mgbe.

Ha kwekọrịtara na ọ bụ ọrụ ndị omeiwu ịlekọta ọrụ gọọmenti ịmata ka ya bụ 'ọnwụ egbukwara ka a rụrụ aka.'

Onyeisi ụlọomeiwu nta bụ Femi Gbajabiamile enyela Godswill Akpabio abalị abụ ịkpọpụta aha ndị niile ọ sị weere ọrụ na NDDC.

Dịka ndị mmadụ na-ekwu maka ihe mere ụnyaahụ n'ụlọomeiwu nta mgbe a na-agba mịnịsta Niger Delta bụ Godswill Akpabio ajụjụọnụ.

Otu n'ime ihe ndị pụtara na nnyocha ahụ bụ ebubo Akpabio boro ndị omeiwu nke ọ sị na ọ bụ ndị omeiwu ji ọtụtụ ọrụngo si n'aka ụlọọrụ NDDC.

Nke a gbakara ndị mmadụ isi nke mere ọtụtụ ji jụwa ajụjụ dị iche iche.

Otu n'ime ajụjụ ndị a bụ na "Ọ bụ ihe ọjọọ ma ndị omeiwu nara ọrụngọ mgbe ha nọ n'ọchịchị?"

Otu onye ọkaiwu kajara akaja ọnụ na-eru n'okwu bụ Malachy Ugwummadu sị na "ọ jọgburu onwe ya ndị omeiwu itinye aka n'ọrụngo mgba ha nọ n'ọchịchị".

Malachy Ugwummadu

Ebe foto si, Malachy Ugwummadu/Facebook

Nkọwa foto, Malachy Ugwummadu bụ ọkaiwu nakwa ọnụ na-eru n'okwu n'ihe banyere mmekọrịta ọha.

Ugwummadu sị na nke mbụ, na agwa a ha kpara megidere usoro okike ọrụ na gọọmenti nke Bekee kpọrọ 'seperation of powers".

Ọ sị na ọrụ ndị omeiwu bụ ịlekọta ka e sị rụọ ọrụ, na ọ bụghị ịweghara ọrụ.

Na ọ bụ ya ka Bekee kpọrọ "conflict of interest".

Ọ sị na ọ bụ ebe ahụ ka ha sị kụọ isi n'ala, maka na o megidere iwu obodo dị n'agba nke iri asatọ na asatọ, amaokwu nke anọ (Section 88, sub-section 4) nke iwu ọchịchị Naịjirịa.

O kwukwara na ya bụ ajọ agwa gosipụtara mpụ na nrụrụaka kere gọomentị etiti agbụ bụ nke ekweghị ya megherịa ahụ.

Ugwummadu sị na nke ka njọ bụ na ọrụngo a niile ha nyere esoghi n'usoro okwesịrị dịka ụlọọrụ Code of Conduct Bureau si depụta n'akwụkwọ iwu ha.

Mgba ajụrụ ya maka iwu onyeisi ụlọomeiwu nta bụ Femi Gbajabiamila nyere ka Akpabio kpọpụta aha ndị ọ sị naara ọrụngo na NDDC, Ugwummadu sị na ọ bụ nke ahụ ga-eme ka ndị omeiwu gbaa onwe ha n'anwụ.

Ọ sị na ya nwere olileanya na dị mmadụ, ọkachasị ndị Niger Delta ga-akwanye ọkụ n'okwu ahụ nke ga-eme ka Akpabio kpọpụta ha ndị a niile.

Ọ sị na obi adịghị ndị Niger Delta mma mgbe ha nụrụ na ọ bụ Akpabio ji ọkwa mịnịsta Niger Delta.

Mana Ugwummadu nwere okwukwe na okwu a bụ oke ikuku kuru ga-eme ka ahụ ike ọkụkụ.

Edeh n'onwe ya chere na ọnweghị ihe ga-apụta na ya bụ okwu, ọgwụchaa ma onyeisiala etinyere ya anya.

O kwukwara na ndị omeiwu ikpe mara nwereike ị nweta onwe ha na mkpọrọ ma onyeisiala sie ọnwụ ka ya bụ okwu soro usoro dịka iwu kwuru.

Akụkọ ga-amasị gị