National Assembly: Ụlọomeiwu emechiela ọru afọ 2019
Ụlọomeiwu emechiela ọrụ nke 2019

Ebe foto si, Twitter/Nass
Ndị omeiwu Naịjirịa emechiela ọrụ nke afọ 2019 rue mgbe ha ga-emepe ọzọ n'ụbọchị iri abụọ na asatọọ nke ọnwa Jenụwarị 2020.
Ọnyeisi ụlọomeiwu ukwu bụ Ahmed Lawan ji ohere ahụ kpọpụta aha Smart Adeyemi nke Kogi West dịka onyeisioche na ahụ maka kọmitee njem ụgbọelu.
EFCC anwuchiela onyeisi CBN adigboroja

Ebe foto si, EFCC
Ụlọọrụ Economic and Financial Crimes Commission (EFCC) anwụchiela otu nwoke ji aha Godwin Emefiele egwu ndị mmadụ chandum.
Nwoke ahụ bụ Onyebuchi Nwalozie Julius gbara ama na ya ejile ya bụ ajọ ọrụ gwuo ndị mmadụ ego ruru nde naịra anọ na ụma ise n'Uyo, Akwa Ibom Steeti, tupu aka akpara ya bụ ezekudele.
Onyebuchi kwetere na ya ji akara email [email protected] eme ndị mmadụ anụrụ anya e were ego.
O kwuru na ya ji ya bụ ụzọ aghụghọ napụ otu nwaamdị onye mba Arab aha ya bụ Omar Es Sh Deebọkpụrụ ego bụ nke o ji Western Union were zitere ya.
O kwetere na ọ bụ ya ji okpueze ịchepụta akara email nke mmadụ agaghị enyo enyo bụ nke ya ji atụ ya bụ akwụkwọ.
Ihedioha akpọkuola ibe maka mmepe obodo

Ebe foto si, Emeka Ihedioha/Twitter
Dịka ụlọikpe dị elu kpebigoro ikpe maka ntuliala ndị gọvanọ 2019 nke Imo steeti, gọvanọ Imo steeti bụ Emeka Ihedioha akpọọla Uche Nwosu ka ọ bịa soro ya na mmepe steeti ahụ.
N'ozi odeakwụkwọ ya bụ Chibuike Onyeukwu tinyere aka, Ihedioha rịọrọ ndị niile ya na ha zọrọ ya bụ ọkwa ka kpofuo ihe gara aga bịa tinyere ya aka n'idozi Imo steeti.
Trump chọrọ ya ngwa ngwa

Ebe foto si, Reuters
N'ofesi eh! Dịka ndị ụlọomeiwu nta kpabigoro ikike Donald Trump dịka onyeisiala mba Amerịka, ya bụ onyeisi na-arịọzịka ka ndị omeiwu ukwu bịa mee nke ha ngwa ngwa ka ya mara ebe ya kwu.
Ndị kwe ndị ekwe dị n'etiti ndị Demokrat na Rịpọbịkan ekweghị mara mgbe ya bụ ikpe ndị Sịnetị ga-adị.
Arteta achirila uwe Arsenal

Ebe foto si, Getty Images
N'egwuregwu, ndi otu egwu bọọlụ Arsenal enweela onye nchịkọta ọzọ.
Aha ya bụ Mikel Arteta mana ajụjụ bụ na Mikel, ọ ga-azọ Arsenal?.
Cheta na Arteta bụbu osote onye nchịkọta ndị Manchester City ruo mgbe ya na ndị Arsensal tinyere aka n'akwụkwọ.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Gee akụkọ ndị n'otu nkeji

Ebe foto si, Twitter/@iamekweremadu
Onyeisiala Muhammadu Buhari akasiela ezinaụlọ Benjamin Uwajumogu obi.
Uwajumogu bụ onye omeiwu na-anọchị anya Imo North nke lara mmụọ ụbọchị Wenezde.
N'ozi si n'aka ọnụ na-ekwuru onyeisiala bụ Garba Shehu, Buharị kwuru na ọtụtụ ozi iti aka n'obi nke ndị mmadụ na-ezigara ezinaụlọ Uwajumogu gosiri na nwa amadị ahụ fere ala nna ya nke ọma.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
N'otu aka ahụ kwa, Gọvanọ Imo steeti bụ Emeka Ihedioha na ọtụtụ ndị ọzọ ọnụ na-eru n'okwu bekwara arịrị maka onwụ Uwajumogu.
Ihedioha kwuru na ọnwụ Uwajumogu wutere ya nke ukwu, ma rịọ Chineke ka ọ nabata mkpuruobi ya.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Ike Ekweremadu, onye bụbu osote onyeisi ụlọomeiwu ukwu, kwupụtakwara mwute ya maka ọnwụ Uwajumogu.
Ekweremadu kọwara Uwajumogu dịka onye omeiwu ma ihe ọ na-eme.
Akụkọ kwuru na Uwajumogu gharịpụrụ na mberede n'ime ụlọ ya.
Mgbe e buru ya gbaga ụlọọgwụ, ndị dọkịta kwuru na ọ laala mmụo.
Ọtụtụ ndị chịburu dịka gọvanọ ka na-aza ụgba

Ihe ruru mmadụ iri abụọ na abụọ bụ ndị jibu ọkwa gọvanọ ka gọọmentị etiti na-enyocha ugbua maka nrụrụaka.
Onye kwuru nke a bụ ọkaiwu gọọmentị etiti bụ Abubakar Malami.
O kwuru na nke a bụ iji gosipụta na ọchịchị Muhammadu Buhari anaghị ele onye ọbụla anya n'ihu n'okwu gbasara nrụrụaka.
Malami kọwakwara na mmadụ dị otu puku na narị isii na iri atọ na isii (1,636) bụ ndị ụlọikpe marala ikpe maka nrụrụaka bido n'afọ 2015 ruo 2019.
New Zealand amachiela mmadụ inwe egbe ndị agha

Bido n'abalị iri abụọ na otu nke ọnwa Disemba afọ 2019, ọ ga-abụ ihe megidere iwu mmadụ inwe egbe yiri ụdị nke ndị agha na mba New Zealand.
Mmachi a bụ iji gbochie ụdị ihe mere n'ọnwa Maach oge otu nwoke bu egbe baa n'ụlọụka ndị alakụba gbagbuo mmadụ iri ise na otu.
Gọọmentị mba ahụ amalitela imebi ọtụtụ egbe bụ nke a nakọtara ndị mmadụ.
Mana ọtụtụ ndị na-ekwu na atụmatụ ahụ adịchaghị mma n'ihi na ọ na-anapụ ndị mmadụ ihe ha ji echekwa onwe ha.
Mikel Arteta agaala Arsenal

Ebe foto si, Getty Images
A na-atụ anya na ndị otu egwuregwu bọọlụ Arsenal ga-ahọrọ Mikel Arteta dịka onye nkuzi ha n'ụbọchị Fraịdee.
Cheta na Arteta gbabuuru Arsenal bọọlụ n'oge gara aga tupu ọ laa ezumke nka.
Akụkọ ndị ọọ ga-amasị gị:
Ihe nkiri ga-amasị gị:












